previous next

LUK 22

1 Ma ememe achicha ekoghi-eko, nke anakpọ Ngabiga, nēru nso.

2 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi b͕u Ya; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju.
3 Setan we ba nime Judas onye anakpọ Iskariot, onye di n'ọnu-ọgugu ndi-ozi iri na abua ahu. 4 O we je, ya na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ọchi-agha we kparia, otú ọ gēsi rara Ya nye n'aka-ha. 5 Ha we ṅuria ọṅu, we kwekọ inye ya ego.

6 O we kwere, we nāchọ oghere irara Ya nye n'aka-ha mb͕e ìgwè madu nānọghi.
7 Ma ubọchi achicha ekoghi-eko biara, nke anāghaghi ichu àjà ngabiga. 8 O we zipu Pita na Jọn, si, Ganu, doziere ayi oriri ngabiga, ka ayi we rie. 9 Ha we si Ya, Òle ebe I nācho ka ayi dozie? 10 Ọ si ha, Le, mb͕e unu batasiri nime obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute unu; sonu ya ba n'ulo nke ọ nābà nime ya. 11 Unu gāsi kwa nna-nwe ulo ahu, Onye-ozizí si gi, Òle ebe ulo-ọbìa di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga? 12 Onye ahu gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo: dozienu n'ebe ahu.

13 Ha we je, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga.
14 Mb͕e oge hour ahu ruru, O we nọdu na nri, Ya na ndi-ozi-Ya. 15 O we si ha, Agu gusirim ike iso unu ri oriri ngabiga nka mb͕e Mu akāhughi ahuhu: 16 n'ihi na asim unu, M'gaghi-eri ya ma-ọli, rue mb͕e ọ gēmezu n'ala-eze Chineke. 17 O we nara iko, kele kwa, we si, Naranu nka, kè kwa ya n'etiti onwe-unu: 18 n'ihi na asim unu, M'gaghi-aṅu ihe si n'osisi vine puta ma-ọli site ugbu a, rue mb͕e ala-eze Chineke gābia. 19 O we nara ob͕e achicha, kele kwa, we nyawa ya, nye ha, si, Nka bu arum nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka anu we nēchetam. 20 Mb͕e ha risiri nri-anyasi Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram, bú nke anāwusi n'ihi unu. 21 Ma le, aka onye nāraram nye diyerem n'elu table. 22 N'ihi na Nwa nke madu nāga n'ezie, dika akaworo ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Ya nye.

23 Ha we malite ijurita onwe-ha, onye ọ bu n'etiti ha gēme ihe a.
24 Esem-okwu we da kwa n'etiti ha, onye nime ha ka anāgu na ọ ka ibe-ya uku. 25 O we si ha, Ndi-eze nke mba ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi nāchi kwa ha ka anākpọ ndi nālu ọlu ọma. 26 Ma unu onwe-unu agaghi-adi otú a: kama onye ka ibe-ya uku n'etiti unu, ya di ka onye bu nwata; onye bu kwa onye-isi, ya di ka onye nēje ozi. 27 N'ihi na ònye ka ibe-ya uku, onye nānọdu na nri, ma-ọbu onye nēje ozi? ọ̀ bughi onye nānọdu na nri? ma Mu onwem di n'etiti unu ka onye nēje ozi. 28 Ma unu onwe-unu bu ndi soworom n'ọnwunwam nile; 29 Mu onwem nāb͕a kwa ndu inye unu ala-eze, dika Nnam b͕ara ndu inyem, 30 ka unu we rie ṅu kwa na table nkem n'ala-ezem; unu gānọkwasi kwa n'oche-eze nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé. 31 Saimon, Saimon, le, Setan riọtara unu, ka ọ yọcha unu dika ọka: 32 ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike. 33 O we si Ya, Onye-nwe-ayi, abum onye edoziworo iso Gi ga rue ulo-nkpọrọ ru kwa ọnwu.

34 O we si, Asim i, Pita, oke-ọkuku agaghi-akwá ta, rue mb͕e i gāgọ ub͕ò atọ, si na i mataghim.
35 O we si ha, Mb͕e M'zipuru unu nējighi àkpà-ego, na àkpà-ije, na akpukpọ-ukwu, ọ̀ di ihe kọrọ unu? Ha si, Ọ dighi ihe kọrọ ayi. 36 O we si ha, Ma ub͕u a, onye nwere àkpà-ego, ya were ya, onye nwere àkpà-ije, ya were kwa ya: ma onye nēnweghi, ya re uwe-ya, zuta mma-agha. 37 N'ihi na asim unu, na ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu n'arum, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya: n'ihi na ihe dirim nwere ọgwugwu.

38 Ha we si, Onye-nwe-ayi, le, mma-agha abua di n'ebe a. O we si ha, O zuwo.
39 O we puta, ga ugwu Olive, dika Ọ nēme mb͕e dum; ndi nēso uzọ-Ya soro kwa Ya. 40 Ma mb͕e O ruru n'ebe ahu, Ọ siri ha, Nēkpenu ekpere ka unu ghara ibà n'ọnwunwa. 41 Ewe weputa Ya onwe-ya n'etiti ha dika ebe agāturu nkume; O we b͕ue ikperè n'ala we nēkpe ekpere, 42 si, Nna, ọ buru na ọ di Gi nma, naram iko a: otú ọ di, ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ. 43 Ewe me ka Ọ hu mọ-ozi nke si n'elu-igwe bia, nēnye Ya ike. 44 Ma ebe o nēb͕u Ya nb͕u n'obi ri nne Ọ kpe ekpere si-ike karia: ọsusọ-Ya we ghọ ihe dika oké ọkpurukpu ọbara nāda n'ala. 45 Mb͕e O biliri n'ekpere-Ya, O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura site n'ihe-nwuta,

46 O we si ha, Gini mere unu nāraru ura? bilienu nēkpe kwa ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa.
47 Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, ìgwè madu biara; onye ahu anākpọ Judas, bú otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, buru kwa ha uzọ nābia; o we bia rue Jisus nso isutu Ya ọnu. 48 Ma Jisus siri ya, Judas, ì ji isutu-ọnu nārara Nwa nke madu nye? 49 Ma mb͕e ndi nọ Ya gburugburu huru ihe gādi, ha si, Onye-nwe-ayi, àyi gēwere mma-agha b͕ue? 50 Otù onye nime ha we b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. 51 Ma Jisus zara, si, Kwenu ya rue nka. O we metu nti-ya aka, me ka aru di ya ike. 52 Jisus we si ndi-isi-nchu-àjà, na ndi-ọchi-agha nke ulo uku Chineke, na ndi-okenye, ndi biara imegide Ya, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi, dika imegide onye nāpunara madu ihe?

53 Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri.
54 Ha we jide Ya, duru Ya je, dubà kwa Ya n'ulo onye-isi-nchu-àjà. Ma Pita nēso n'ebe di anya. 55 Ma mb͕e ha funwuru ọku n'etiti obí, we nọdu ala n'otù, Pita we nọdu n'etiti ha. 56 Ma otù nwa-ab͕ọghọ huru ya ka ọ nọduru n'ìhè ọku ahu, o we legide ya anya, si, Nwoke a na Ya nọ-kwa-ra. 57 Ma ọ gọrọ, si, Nwanyi amataghim Ya. 58 Mb͕e nwa oge gasiri onye ọzọ we hu ya, si, Gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha. Ma Pita siri, Nwoke, abughim. 59 Ma mb͕e ihe dika otù oge hour gasiri onye ọzọ kwusibere ike, si, N'ezie nwoke a na Ya nọkwara: n'ihi na ọ bu kwa onye Galili. 60 Ma Pita siri, Nwoke, amataghim ihe i nēkwu. Ngwa ngwa, mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, oke-ọkuku we kwa ákwá. 61 Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ.

62 O we pua, kwa ákwá nke-uku.
63 Ndikom ndi jidere Jisus we me Ya ihe-ọchì, pia kwa Ya ihe. 64 Ha we kechi iru-Ya, jua Ya, si, Bue amuma: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka?

65 Ọtutu ihe ọzọ ka ha kwuru megide Ya, nēkwulu Ya.
66 Mb͕e chi bọrọ, nb͕akọ ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ, ma ndi-isi-nchu-àjà ma ndi-ode-akwukwọ; ha we duru Ya ga ba na nnọkọ-ikpé-ha, si, 67 Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist, gwa ayi. Ma Ọ siri ha, Ọ buru na Mu agwa unu, unu agaghi-ekwe ma-ọli: 68 ma ọ buru na Mu aju unu ajuju, unu agaghi-aza ma-ọli. 69 Ma site n'ub͕u a ka Nwa nke madu gānọdu n'aka-nri nke ike Chineke. 70 Ha nile si, Gì onwe-gi bu kwa Ọkpara Chineke? Ọ si ha, Unu onwe-unu si na Mu onwem bu Ya. 71 Ha we si, Ọ̀ bu nkpà àmà gini nākpa ayi ọzọ? n'ihi na ayi onwe-ayi nuru site n'ọnu-Ya.

Luke 22

1 Now the feast of unleavened bread drew nigh, which is called the Passover.2 And the chief priests and the scribes sought how they might put him to death; for they feared the people.3 And Satan entered into Judas who was called Iscariot, being of the number of the twelve.4 And he went away, and communed with the chief priests and captains, how he might deliver him unto them.5 And they were glad, and covenanted to give him money.6 And he consented, and sought opportunity to deliver him unto them in the absence of the multitude.7 And the day of unleavened bread came, on which the passover must be sacrificed.8 And he sent Peter and John, saying, Go and make ready for us the passover, that we may eat.9 And they said unto him, Where wilt thou that we make ready?10 And he said unto them, Behold, when ye are entered into the city, there shall meet you a man bearing a pitcher of water; follow him into the house whereinto he goeth.11 And ye shall say unto the master of the house, The Teacher saith unto thee, Where is the guestchamber, where I shall eat the passover with my disciples?12 And he will show you a large upper room furnished: there make ready.13 And they went, and found as he had said unto them: and they made ready the passover.14 And when the hour was come, he sat down, and the apostles with him.15 And he said unto them, With desire I have desired to eat this passover with you before I suffer:16 for I say unto you, I shall not eat it, until it be fulfilled in the kingdom of God.17 And he received a cup, and when he had given thanks, he said, Take this, and divide it among yourselves:18 for I say unto you, I shall not drink from henceforth of the fruit of the vine, until the kingdom of God shall come.19 And he took bread, and when he had given thanks, he brake it, and gave to them, saying, This is my body which is given for you: this do in remembrance of me.20 And the cup in like manner after supper, saying, This cup is the new covenant in my blood, even that which is poured out for you.21 But behold, the hand of him that betrayeth me is with me on the table.22 For the Son of man indeed goeth, as it hath been determined: but woe unto that man through whom he is betrayed!23 And they began to question among themselves, which of them it was that should do this thing.24 And there arose also a contention among them, which of them was accounted to be greatest.25 And he said unto them, The kings of the Gentiles have lordship over them; and they that have authority over them are called Benefactors.26 But ye shall not be so: but he that is the greater among you, let him become as the younger; and he that is chief, as he that doth serve.27 For which is greater, he that sitteth at meat, or he that serveth? is not he that sitteth at meat? but I am in the midst of you as he that serveth.28 But ye are they that have continued with me in my temptations;29 and I appoint unto you a kingdom, even as my Father appointed unto me,30 that ye may eat and drink at my table in my kingdom; and ye shall sit on thrones judging the twelve tribes of Israel.31 Simon, Simon, behold, Satan asked to have you, that he might sift you as wheat:32 but I made supplication for thee, that thy faith fail not; and do thou, when once thou hast turned again, establish thy brethren.33 And he said unto him, Lord, with thee I am ready to go both to prison and to death.34 And he said, I tell thee, Peter, the cock shall not crow this day, until thou shalt thrice deny that thou knowest me.35 And he said unto them, When I sent you forth without purse, and wallet, and shoes, lacked ye anything? And they said, Nothing.36 And he said unto them, But now, he that hath a purse, let him take it, and likewise a wallet; and he that hath none, let him sell his cloak, and buy a sword.37 For I say unto you, that this which is written must be fulfilled in me, And he was reckoned with transgressors: for that which concerneth me hath fulfilment.38 And they said, Lord, behold, here are two swords. And he said unto them, It is enough.39 And he came out, and went, as his custom was, unto the mount of Olives; and the disciples also followed him.40 And when he was at the place, he said unto them, Pray that ye enter not into temptation.41 And he was parted from them about a stone’s cast; and he kneeled down and prayed,42 saying, Father, if thou be willing, remove this cup from me: nevertheless not my will, but thine, be done.43 And there appeared unto him an angel from heaven, strengthening him.44 And being in an agony he prayed more earnestly; and his sweat became as it were great drops of blood falling down upon the ground.45 And when he rose up from his prayer, he came unto the disciples, and found them sleeping for sorrow,46 and said unto them, Why sleep ye? rise and pray, that ye enter not into temptation.47 While he yet spake, behold, a multitude, and he that was called Judas, one of the twelve, went before them; and he drew near unto Jesus to kiss him.48 But Jesus said unto him, Judas, betrayest thou the Son of man with a kiss?49 And when they that were about him saw what would follow, they said, Lord, shall we smite with the sword?50 And a certain one of them smote the servant of the high priest, and struck off his right ear.51 But Jesus answered and said, Suffer ye them thus far. And he touched his ear, and healed him.52 And Jesus said unto the chief priests, and captains of the temple, and elders, that were come against him, Are ye come out, as against a robber, with swords and staves?53 When I was daily with you in the temple, ye stretched not forth your hands against me: but this is your hour, and the power of darkness.54 And they seized him, and led him away, and brought him into the high priest’s house. But Peter followed afar off.55 And when they had kindled a fire in the midst of the court, and had sat down together, Peter sat in the midst of them.56 And a certain maid seeing him as he sat in the light of the fire, and looking stedfastly upon him, said, This man also was with him.57 But he denied, saying, Woman, I know him not.58 And after a little while another saw him, and said, Thou also art one of them. But Peter said, Man, I am not.59 And after the space of about one hour another confidently affirmed, saying, Of a truth this man also was with him; for he is a Galilaean.60 But Peter said, Man, I know not what thou sayest. And immediately, while he yet spake, the cock crew.61 And the Lord turned, and looked upon Peter. And Peter remembered the word of the Lord, how that he said unto him, Before the cock crow this day thou shalt deny me thrice.62 And he went out, and wept bitterly.63 And the men that held Jesus mocked him, and beat him.64 And they blindfolded him, and asked him, saying, Prophesy: who is he that struck thee?65 And many other things spake they against him, reviling him.66 And as soon as it was day, the assembly of the elders of the people was gathered together, both chief priests and scribes; and they led him away into their council, saying,67 If thou art the Christ, tell us. But he said unto them, If I tell you, ye will not believe:68 and if I ask you, ye will not answer.69 But from henceforth shall the Son of man be seated at the right hand of the power of God.70 And they all said, Art thou then the Son of God? And he said unto them, Ye say that I am.71 And they said, What further need have we of witness? for we ourselves have heard from his own mouth.