LUK 23
1 Ọra ndi ahu nile we bilie, duru Ya je n'iru Pailat. 2 Ha we malite ibo Ya ebubo, si, Ayi huru Onye a, ka O nēduhie mba-ayi, nēb͕ochi ha itu ùtú nye Sisa, nāsi kwa na Ya onwe-ya bu Kraist, buru kwa Eze. 3 Pailat we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru. 4 Pailat we si ndi-isi-nchu-àjà na ìgwè madu nile, Ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie n'aru Nwoke a. 5 Ma ha kwusiri ike kari, si, Ọ nākwali ndi-Ju, nēzí ihe n'ebe nile di na Judia dum, nāmalite kwa site na Galili rue ebe a. 6 Ma mb͕e Pailat nuru ya, ọ jua ma Nwoke a bu onye Galili.
7 Mb͕e ọ mazuru na O si n'ebe Herod nāchi bia, o we ziga Ya jekuru Herod, onye ya onwe-ya nọ kwa na Jerusalem na mb͕e ahu.
8 Ma mb͕e Herod huru Jisus, Ọ ṅuria ọṅu nke-uku: n'ihi na ọ nāchọ ihu Ya anya n'oge di anya gara aga, n'ihi na ọ nuru ihe bayere Ya; o we nēle anya ihu ihe-iriba-ama di aṅa Ọ gēme. 9 O we jua Ya ajuju n'ọtutu okwu; ma Ya onwe-ya azaghi ya ihe ọ bula. 10 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we guzo, nēbo Ya ebubo si-ike. 11 Herod, ya na ndi-agha-ya, we me Ya ka Ọ buru ihe-efu, o me-kwa-ra Ya ihe-ọchì, we b͕okwasi Ya uwe mara nma nke-uku we zighachi Ya jekuru Pailat.
12 Herod na Pailat we me eyì n'etiti onwe-ha n'ubọchi ahu: n'ihi na n'oge gara aga ha bu ndi-iro.
13 Pailat we kpọkọ ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi na ndi-Ju, 14 si ha, Unu kutaram Nwoke a, dika onye nēduhie ndi-Ju: ma le, mu onwem kpere Ya ikpé n'iru unu, ma ahughim ihe ọ bula n'aru Nwoke a kwesiri ahuhu-nmehie n'ihe nile unu ji bo Ya ebubo: 15 é-è, ọbuná Herod ahugh: n'ihi na o zighachiri Ya nye ayi; le kwa, ọ dighi ihe ọ bula kwesiri ọnwu nke O meworo. 16 Ya mere, m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya. 17 Ma ọ di ya nkpà irapuru ha otù onye-nkpọrọ n'ememe. 18 Ma ha nile tiri nkpu n'otù, si, Wepu Nwoke a, ma rapuru ayi Barabas: 19 onye atubàra n'ulo-nkpọrọ n'ihi otù nbili imegide ndi-isi ebiliri nime obodo ahu, ya na ib͕u-madu. 20 Pailat we gwa ha okwu ọzọ, ebe ọ nāchọ irapu Jisus; 21 ma ha tiri nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe. 22 O we si ha nke ub͕ò atọ, É-è, n'ìhi na Onye a mere ihe ọjọ gini? Ahughm ihe kwesiri inwu anwu n'aru Ya: ya mere m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya. 23 Ma ha were oké olu rugide, nāriọ ka akpọgide Ya n'obe. Olu-ha we kari ya ike. 24 Pailat we kpebì ka eme ihe ha riọrọ.
25 O we rapuru ha onye ahu atubàrari n'ulo-nkpọrọ n'ihi nbili imegide ndi-isi na ib͕u-madu, onye ha riọrọ n'aka-ya; ma ọ rara Jisus nye ka eme Ya ihe ha chọrọ.
26 Mb͕e ha nēdupu Ya, ha we jide otù onye, bú Saimon, onye Sairini, nke si n'azu obodo ahu bia, ha we bokwasi ya obe-Ya, ka o buru ya so Jisus.
27 Oké ìgwè ndi-Ju nēso kwa Ya, ya na ìgwè ndinyom ndi nēti aka n'obi nākwa-kwa-ra Ya ákwá. 28 Ma Jisus chighariri n'ebe ha nọ, si, Umu-nwanyi Jerusalem, unu akwalaram ákwá, kama nākwaranu onwe-unu na umu-unu. 29 N'ihi na le, ubọchi nābia, mb͕e ha gāsi, Ngọzi nādiri ndinyom àgà, na afọ nke nāmughi nwa, na ara nke nāzùghi nwa. 30 Mb͕e ahu ka ha gāmalite isi ugwu, Dakwasinu ayi; na isi ugwu ntà, Kpuchienu ayi.
31 N'ihi na asi na ha nēme ihe ndia mb͕e osisi di ndu, gini ka agēme mb͕e ọ kpọrọ nku?
32 Ma ndikom abua ọzọ, ndi nālu ọlu ọjọ, ka edukwara, Ya na ha, ka eb͕ue ha.
33 Ma mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Okpokoro-isi, n'ebe ahu ka ha kpọgidere Ya na ndi ahu nālu ọlu ọjọ n'obe, otù onye n'aka-nri-Ya na onye ọzọ n'aka-ekpe-Ya. 34 Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà. 35 Ndi-Ju nēguzo kwa, nēkiri. Ndi-isi we me kwa Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ya zọputa Onwe-ya, ọ buru na Onye a bu Kraist nke Chineke, Onye Ọ rọputara. 36 Ndi-agha we me kwa Ya ihe-ọchì, nābiakute Ya, nēche kwa n'iru Ya manya-vine b͕ara uka, 37 si, Ọ buru na Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju, zọputa Onwe-gi.
38 Ma ihe-ndekwasi di kwa n'elu isi-Ya, ONYE A BU EZE NDI-JU.
39 Otù nime ndi ahu nālu ọlu ọjọ ndi akwubara nēkwulu kwa Ya, si, Gì onwe-gi abughi Kraist ahu? zọputa Onwe-gi na ayi. 40 Ma ibe-ya zara, we bara ya mba, si, Gì onwe-gi adighi-atu egwu ọbuná Chineke, ebe i nọ n'ọmuma-ikpé ahu? 41 N'ezi-okwu amakwara ayi ikpé ziri ezi; n'ihi na ayi nānata ihe kwesiri ihe ayi mere: ma ọ dighi ihe ọ bula Onye a mehiere. 42 O we si, Jisus, chetam mb͕e ọ bula I gābia n'ala-eze-Gi.
43 Ọ we si ya, N'ezie asim i, Ta ka Mu na gi gānọ na Paradais.
44 Ma ub͕u a ọ di ka oge hour nke-isi, ọchichiri we b͕a n'ala ahu dum rue oge hour nke-iteghete, 45 n'ihi na anyanwu nāb͕a itiri: ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa n'etiti. 46 Mb͕e Jisus tisiri nkpu n'oké olu, Ọ si, Nna, n'aka-Gi ka M'nēnye mọm idebe: mb͕e O kwusiri nka, O we kubìe ume. 47 Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise huru ihe mere, o tobe Chineke, si, N'ezi-okwu Nwoke a bu onye ezi omume. 48 Ìgwè madu nile ndi zukọrọ n'ihe-nkiri a, mb͕e ha kirisiri ihe nile mere, ha we laghachi nēti aka n'obi-ha.
49 Ndi nile ndi mara Ya nke-ọma, na ndinyom ndi soro Ya site na Galili, guzokwara n'ebe di anya, nēle ihe ndia.
50 Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Josef, onye bu onye-nnọkọ-ikpé, ọ bu ezi nwoke buru kwa onye ezi omume, 51 (onye ahu ekweyeghi ìzù-ha na omume-ha), onye sitere n'Arimatia, otù obodo ndi-Ju, onye nēche ala-eze Chineke: 52 onye ahu jekuru Pailat, riọ aru Jisus. 53 O we budata ya, ke ya n'ezi ákwà ọcha, we tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwara ya-ri na nkume, nke akātọb͕ọghi onye ọ bula nime ya. 54 Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe, ubọchi-izu-ike nēru kwa nso. 55 Ndinyom, ndi si na Galili soro Ya bia, we so n'azu, le ílì ahu, na otú atọb͕ọrọ aru-Ya.
56 Ha we laghachi, dozie uda utọ di ichi iche na manu-otite.
N'ubọchi-izu-ike ha we nọdu nwayọ dika ihe enyere n'iwu si kwu.
Luke 23
1 And the whole company of them rose up, and brought him before Pilate.2 And they began to accuse him, saying, We found this man perverting our nation, and forbidding to give tribute to Caesar, and saying that he himself is Christ a king.3 And Pilate asked him, saying, Art thou the King of the Jews? And he answered him and said, Thou sayest.4 And Pilate said unto the chief priests and the multitudes, I find no fault in this man.5 But they were the more urgent, saying, He stirreth up the people, teaching throughout all Judaea, and beginning from Galilee even unto this place.6 But when Pilate heard it, he asked whether the man were a Galilaean.7 And when he knew that he was of Herod’s jurisdiction, he sent him unto Herod, who himself also was at Jerusalem in these days.8 Now when Herod saw Jesus, he was exceeding glad: for he was of a long time desirous to see him, because he had heard concerning him; and he hoped to see some miracle done by him.9 And he questioned him in many words; but he answered him nothing.10 And the chief priests and the scribes stood, vehemently accusing him.11 And Herod with his soldiers set him at nought, and mocked him, and arraying him in gorgeous apparel sent him back to Pilate.12 And Herod and Pilate became friends with each other that very day: for before they were at enmity between themselves.13 And Pilate called together the chief priests and the rulers and the people,14 and said unto them, Ye brought unto me this man, as one that perverteth the people: and behold, I having examined him before you, found no fault in this man touching those things whereof ye accuse him:15 no, nor yet Herod: for he sent him back unto us; and behold, nothing worthy of death hath been done by him.16 I will therefore chastise him, and release him.17 Now he must needs release unto them at the feast one prisoner.18 But they cried out all together, saying, Away with this man, and release unto us Barabbas: --19 one who for a certain insurrection made in the city, and for murder, was cast into prison.20 And Pilate spake unto them again, desiring to release Jesus;21 but they shouted, saying, Crucify, crucify him.22 And he said unto them the third time, Why, what evil hath this man done? I have found no cause of death in him: I will therefore chastise him and release him.23 But they were urgent with loud voices, asking that he might be crucified. And their voices prevailed.24 And Pilate gave sentence that what they asked for should be done.25 And he released him that for insurrection and murder had been cast into prison, whom they asked for; but Jesus he delivered up to their will.26 And when they led him away, they laid hold upon one Simon of Cyrene, coming from the country, and laid on him the cross, to bear it after Jesus.27 And there followed him a great multitude of the people, and of women who bewailed and lamented him.28 But Jesus turning unto them said, Daughters of Jerusalem, weep not for me, but weep for yourselves, and for your children.29 For behold, the days are coming, in which they shall say, Blessed are the barren, and the wombs that never bare, and the breasts that never gave suck.30 Then shall they begin to say to the mountains, Fall on us; and to the hills, Cover us.31 For if they do these things in the green tree, what shall be done in the dry?32 And there were also two others, malefactors, led with him to be put to death.33 And when they came unto the place which is called The skull, there they crucified him, and the malefactors, one on the right hand and the other on the left.34 And Jesus said, Father, forgive them; for they know not what they do. And parting his garments among them, they cast lots.35 And the people stood beholding. And the rulers also scoffed at him, saying, He saved others; let him save himself, if this is the Christ of God, his chosen.36 And the soldiers also mocked him, coming to him, offering him vinegar,37 and saying, If thou art the King of the Jews, save thyself.38 And there was also a superscription over him, THIS IS THE KING OF THE JEWS.39 And one of the malefactors that were hanged railed on him, saying, Art not thou the Christ? save thyself and us.40 But the other answered, and rebuking him said, Dost thou not even fear God, seeing thou art in the same condemnation?41 And we indeed justly; for we receive the due reward of our deeds: but this man hath done nothing amiss.42 And he said, Jesus, remember me when thou comest in thy kingdom.43 And he said unto him, Verily I say unto thee, To-day shalt thou be with me in Paradise.44 And it was now about the sixth hour, and a darkness came over the whole land until the ninth hour,45 the sun’s light failing: and the veil of the temple was rent in the midst.46 And Jesus, crying with a loud voice, said, Father, into thy hands I commend my spirit: and having said this, he gave up the ghost.47 And when the centurion saw what was done, he glorified God, saying, Certainly this was a righteous man.48 And all the multitudes that came together to this sight, when they beheld the things that were done, returned smiting their breasts.49 And all his acquaintance, and the women that followed with him from Galilee, stood afar off, seeing these things.50 And behold, a man named Joseph, who was a councillor, a good and righteous man51 (he had not consented to their counsel and deed), a man of Arimathaea, a city of the Jews, who was looking for the kingdom of God:52 this man went to Pilate, and asked for the body of Jesus.53 And he took it down, and wrapped it in a linen cloth, and laid him in a tomb that was hewn in stone, where never man had yet lain.54 And it was the day of the Preparation, and the sabbath drew on.55 And the women, who had come with him out of Galilee, followed after, and beheld the tomb, and how his body was laid.56 And they returned, and prepared spices and ointments. And on the sabbath they rested according to the commandment.