LUK 8
1 O we rue mb͕e nwa oge gasiri, na Ya onwe-ya nāgaghari n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēkwusa nēzikwa ozi ọma ala-eze Chineke, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu, 2 na ndinyom ufọdu ndi emereri ka aru-ha di ike site n'ichupu ndi-mọ ọjọ na igwọ nriaria, Meri nke akpọrọ Magdalini, onye mọ ọjọ asa siwori nime ya puta,
3 na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n'aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha.
4 Ma mb͕e oké ìgwè madu nēzukọ, mb͕e ndi si n'obodo nile nābiakute kwa Ya, O we kwue okwu site n'ilu: 5 Ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru-ya: mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ; ewe zọkwasi ha ukwu, anu-ufe nke elu-igwe we tuturie ha. 6 Nkpuru ọzọ we da n'elu oké nkume; mb͕e ha puru ome, ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi ala miri. 7 Nkpuru ọzọ we da n'etiti ogwu; ogwu ahu we so ha pue, kpab͕ue ha.
8 Nkpuru ọzọ we da n'ezi ala, ha we pue, we mia nkpuru ọgu ise ọgu ise. Mb͕e O nēkwu okwu ndia, O tie nkpu, si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu.
9 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ihe ilu a gābu. 10 O we si, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze Chineke: ma ndi fọduru ka anāgwa okwu n'ilu; ka ha ghara ihu n'ọhuhu, ghara kwa inuta n'ọnunu. 11 Ma ilu ahu bu nka: Nkpuru ahu bu okwu Chineke. 12 Ndi nọ n'akuku uzọ ahu bu ndi nuru; mb͕e ahu ekwensu bia, we napu okwu ahu n'obi-ha, ka ha ghara ikwere, ewe zọputa ha. 13 Ndi nọ kwa n'oké nkume ahu bu ndi were ọṅù nara okwu ahu mb͕e ọ bula ha nuru ya; ma ndia enweghi nkpọrọgwu, ndi kwere na nwa oge, ma n'oge ọnwunwa ha wezuga onwe-ha. 14 Nkpuru nke dara n'etiti ogwu ahu, ndia bu ndi nuru, ma mb͕e ha nāga n'uzọ-ha ncheb͕u na àkù na ihe-utọ nke ndu anākpab͕u ha, ha amighi ezi nkpuru.
15 Nkpuru nke di n'ala ọma ahu, ndia bu ndi were ezi obi di nma jisie okwu ahu ike, mb͕e ha nuru ya, ha were kwa ntachi-obi mia nkpuru.
16 Ma ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nēkpuchi ya n'ihe, ma-ọbu dọba ya n'okpuru ihe-ndina; kama ọ nādọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nke nābà nime we hu ìhè-ya. 17 N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-eme ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe di nzuzo, nke anāgaghi-ama, me kwa ka ọ puta ìhè.
18 Ya mere, lezienu anya otú unu si anu: n'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye; onye ọ bula nēnweghi kwa, ọbuná ihe ọ nēchè na o nwere ka agānapu ya.
19 Ma nne-Ya na umu-nne-Ya biakutere Ya, ma ha apughi ibiaru Ya nso n'ihi ìgwè madu ahu. 20 Ewe si Ya, Nne-gi na umu-nne-gi nēguzo n'èzí, nāchọ ihu Gi anya.
21 Ma Ọ zara, si ha, Nnem na umu-nnem bu ndia ndi nānu okwu Chineke, nēme kwa ya.
22 O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ọ batara n'ub͕ọ, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya; O we si ha, Ka ayi gabiga n'ofè ọdọ-miri a ọzọ: ha we nupu. 23 Ma mb͕e ha nēje Ọ da n'ura: oké ajọ ifufe we da n'ọdọ-miri ahu; miri nēju kwa n'ub͕ọ-ha, ha we nọdu n'ọnu ọnwu. 24 Ha we biakute Ya, kpọte Ya, si, Nna-ayi, Nna-ayi, ayi nāla n'iyì. O we teta, bara ifufe na ebili-miri mba: ha we da juu, ndaju we di.
25 O we si ha, Òle ebe ka okwukwe-unu di? Ha we tua egwu, o ju ha anya, ha sirita onwe-ha, Ònye bu kwa Onye a, na Ọ nēnye ọbuná ifufe na miri iwu, ha nāṅa kwa Ya nti?
26 Ha we rue ala ndi Gerasa, nke di na ncherita-iru Galili. 27 Ma mb͕e O siri n'ub͕ọ puta rigo n'ala, otù nwoke nke si n'obodo ahu puta zutere ya, bú onye nwere ndi-mọ ọjọ; ma na mb͕e di anya ọ dighi uwe o yiri, o bighi kwa n'ulo, kama n'ebe anēlì ozu. 28 Ma mb͕e ọ huru Jisus, o tisie nkpu ike, da kwa n'ala n'iru Ya, were oké olu si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? ariọm Gi, emekpalam aru. 29 N'ihi na O nyere mọ ahu nādighi ọcha iwu ka o si nime nwoke ahu puta. N'ihi na ọtutu mb͕e ka ọ nējisi ya ike: anēche kwa ya nche, ewere kwa nkpọrọ na nkpọrọ-ukwu ke ya; o we nyajipu ihe eji ke ya, mọ ọjọ ahu we churu ya ba n'ọhia. 30 Jisus we jua ya, si, Òle aha-gi? Ọ si, Legion; n'ihi na ọtutu ndi-mọ ọjọ bàra nime ya. 31 Ha we riọ Ya ka ọ ghara inye ha iwu ka ha je ba n'abyss. 32 Ma ìgwè ọtutu ezì di n'ebe ahu nāta nri n'ugwu: ha we riọ Ya ka O kwere ha ka ha ba nime ha. O we kwere ha. 33 Ndi-mọ ọjọ ahu we si nime nwoke ahu puta, ba nime ìgwè ezì ahu: ìgwè ezi ahu we nuda n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'ọdọ-miri, miri we b͕ab͕ue ha. 34 Ma mb͕e ndi nāzù ha huru ihe emereri, ha b͕alaga, kọsa ya n'obodo ahu na gburugburu ya nile. 35 Ha we pua ihu ihe emereri; ha we biakute Jisus, we hu nwoke ahu, nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta, ka ọ nọduru ala n'ukwu Jisus, yiri uwe, uche-ya zu-kwa-ra okè: ha we tua egwu. 36 Ndi huru ya we kọrọ ha otú azọputara onye ahu ndi-mọ ọjọ ji. 37 Ọra nile nke ala ndi Gerasa di ya gburugburu we kpere Ya ka O si n'ebe ha nọ la; n'ihi na ha nātu oké egwu: O we ba nime ub͕ọ, laghachi. 38 Ma nwoke nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta nāriọ Ya ka ya na Ya biri: ma O zilagara ya, si,
39 Laghachi n'ulo-gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke meworo gi. O we je, nēkwusa n'obodo ahu dum ihe Jisus mere ya, ka ha ra.
40 Ma mb͕e Jisus laghachiri, ìgwè madu ahu nara Ya nke-ọma; n'ihi na ha nile nēle anya Ya. 41 Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Jeairọs, biara, ya onwe-ya bu kwa onye-isi ulo-nzukọ: o we da n'ala n'ukwu Jisus, we riọ Ya ka Ọ bia n'ulo-ya;
42 n'ihi na o nwere nwa-nwanyi ọ muru nání ya, nke b͕ara ihe ra ka arọ iri na abua, nwata ahu nānwu kwa anwu. Ma mb͕e Ọ nēje ìgwè madu nile nākpab͕u Ya.
43 Otù nwanyi nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke mefusiri ihe dum o ji biri n'aru ndi-dibia, ma ọ dighi onye ọ bula nwere ike ime ka aru-ya di ike, 44 nwanyi ahu we bia n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ngwa ngwa orùrù-ọbara-ya we guzo. 45 Jisus we si, Ònye bu onye ahu nke meturum aka? Ma mb͕e madu nile di nāgo, Pita na ndi ya na ha yikọ si, Nna-ayi, ìgwè madu ndia nādagide Gi nākpab͕u kwa Gi. 46 Ma Jisus siri, Madu meturum aka: n'ihi na Mu onwem mara na ike esiwori n'arum puta. 47 Ma mb͕e nwanyi ahu huru na o zoghi ezo, o were ima-aru-jijiji bia, we da n'iru Ya, kọ n'iru ndi-Ju ahu nile ihe mere o ji metu Ya aka, na otú esi me ka aru di ya ike ngwa ngwa.
48 Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.
49 Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, otù onye si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwayi anwuruwo; esob͕u-kwa-la Onye-ozizí a ọzọ. 50 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ za ya, si, Atula egwu: kwere nání, agāzọputa kwa ya. 51 Ma mb͕e Ọ biaruru ulo ahu, O kweghi onye ọ bula so Ya ba, ma-ọbughi Pita, na Jọn, na Jemes, na nna nwata-nwayi ahu na nne-ya. 52 Ma madu nile nākwa ákwá, nēti kwa aka n'obi n'ihi ya: ma Ọ siri, Unu akwala ákwá; n'ihi na ọ nwughi anwu, kama ọ nāraru ura. 53 Ha we chìa Ya ọchì, ebe ha matara na ọ nwuru anwu. 54 Ma Ya onwe-ya jidere ya n'aka, we kpọ, si, Nwata-nwanyi, bilie. 55 Mọ-ya we lata, o wè bilie ngwa ngwa: O we si ka enye ya ihe-oriri. 56 Ibobo we nwubiga ndi muru ya ókè n'aru: ma O nyere ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe emereri.
Luke 8
1 And it came to pass soon afterwards, that he went about through cities and villages, preaching and bringing the good tidings of the kingdom of God, and with him the twelve,2 and certain women who had been healed of evil spirits and infirmities: Mary that was called Magdalene, from whom seven demons had gone out,3 and Joanna the wife of Chuzas Herod’s steward, and Susanna, and many others, who ministered unto them of their substance.4 And when a great multitude came together, and they of every city resorted unto him, he spake by a parable:5 The sower went forth to sow his seed: and as he sowed, some fell by the way side; and it was trodden under foot, and the birds of the heaven devoured it.6 And other fell on the rock; and as soon as it grew, it withered away, because it had no moisture.7 And other fell amidst the thorns; and the thorns grew with it, and choked it.8 And other fell into the good ground, and grew, and brought forth fruit a hundredfold. As he said these things, he cried, He that hath ears to hear, let him hear.9 And his disciples asked him what this parable might be.10 And he said, Unto you it is given to know the mysteries of the kingdom of God: but to the rest in parables; that seeing they may not see, and hearing they may not understand.11 Now the parable is this: The seed is the word of God.12 And those by the way side are they that have heard; then cometh the devil, and taketh away the word from their heart, that they may not believe and be saved.13 And those on the rock are they who, when they have heard, receive the word with joy; and these have no root, who for a while believe, and in time of temptation fall away.14 And that which fell among the thorns, these are they that have heard, and as they go on their way they are choked with cares and riches and pleasures of this life, and bring no fruit to perfection.15 And that in the good ground, these are such as in an honest and good heart, having heard the word, hold it fast, and bring forth fruit with patience.16 And no man, when he hath lighted a lamp, covereth it with a vessel, or putteth it under a bed; but putteth it on a stand, that they that enter in may see the light.17 For nothing is hid, that shall not be made manifest; nor anything secret, that shall not be known and come to light.18 Take heed therefore how ye hear: for whosoever hath, to him shall be given; and whosoever hath not, from him shall be taken away even that which he thinketh he hath.19 And there came to him his mother and brethren, and they could not come at him for the crowd.20 And it was told him, Thy mother and thy brethren stand without, desiring to see thee.21 But he answered and said unto them, My mother and my brethren are these that hear the word of God, and do it.22 Now it came to pass on one of those days, that he entered into a boat, himself and his disciples; and he said unto them, Let us go over unto the other side of the lake: and they launched forth.23 But as they sailed he fell asleep: and there came down a storm of wind on the lake; and they were filling with water, and were in jeopardy.24 And they came to him, and awoke him, saying, Master, master, we perish. And he awoke, and rebuked the wind and the raging of the water: and they ceased, and there was a calm.25 And he said unto them, Where is your faith? And being afraid they marvelled, saying one to another, Who then is this, that he commandeth even the winds and the water, and they obey him?26 And they arrived at the country of the Gerasenes, which is over against Galilee.27 And when he was come forth upon the land, there met him a certain man out of the city, who had demons; and for a long time he had worn no clothes, and abode not in any house, but in the tombs.28 And when he saw Jesus, he cried out, and fell down before him, and with a loud voice said, What have I to do with thee, Jesus, thou Son of the Most High God? I beseech thee, torment me not.29 For he was commanding the unclean spirit to come out from the man. For oftentimes it had seized him: and he was kept under guard, and bound with chains and fetters; and breaking the bands asunder, he was driven of the demon into the deserts.30 And Jesus asked him, What is thy name? And he said, Legion; for many demons were entered into him.31 And they entreated him that he would not command them to depart into the abyss.32 Now there was there a herd of many swine feeding on the mountain: and they entreated him that he would give them leave to enter into them. And he gave them leave.33 And the demons came out from the man, and entered into the swine: and the herd rushed down the steep into the lake, and were drowned.34 And when they that fed them saw what had come to pass, they fled, and told it in the city and in the country.35 And they went out to see what had come to pass; and they came to Jesus, and found the man, from whom the demons were gone out, sitting, clothed and in his right mind, at the feet of Jesus: and they were afraid.36 And they that saw it told them how he that was possessed with demons was made whole.37 And all the people of the country of the Gerasenes round about asked him to depart from them, for they were holden with great fear: and he entered into a boat, and returned.38 But the man from whom the demons were gone out prayed him that he might be with him: but he sent him away, saying,39 Return to thy house, and declare how great things God hath done for thee. And he went his way, publishing throughout the whole city how great things Jesus had done for him.40 And as Jesus returned, the multitude welcomed him; for they were all waiting for him.41 And behold, there came a man named Jairus, and he was a ruler of the synagogue: and he fell down at Jesus’ feet, and besought him to come into his house;42 for he had an only daughter, about twelve years of age, and she was dying. But as he went the multitudes thronged him.43 And a woman having an issue of blood twelve years, who had spent all her living upon physicians, and could not be healed of any,44 came behind him, and touched the border of his garment: and immediately the issue of her blood stanched.45 And Jesus said, Who is it that touched me? And when all denied, Peter said, and they that were with him, Master, the multitudes press thee and crush thee.46 But Jesus said, Some one did touch me; for I perceived that power had gone forth from me.47 And when the woman saw that she was not hid, she came trembling, and falling down before him declared in the presence of all the people for what cause she touched him, and how she was healed immediately.48 And he said unto her, Daughter, thy faith hath made thee whole; go in peace.49 While he yet spake, there cometh one from the ruler of the synagogue’s house, saying, Thy daughter is dead; trouble not the Teacher.50 But Jesus hearing it, answered him, Fear not: only believe, and she shall be made whole.51 And when he came to the house, he suffered not any man to enter in with him, save Peter, and John, and James, and the father of the maiden and her mother.52 And all were weeping, and bewailing her: but he said, Weep not; for she is not dead, but sleepeth.53 And they laughed him to scorn, knowing that she was dead.54 But he, taking her by the hand, called, saying, Maiden, arise.55 And her spirit returned, and she rose up immediately: and he commanded that something be given her to eat.56 And her parents were amazed: but he charged them to tell no man what had been done.