previous next

MAK 1

1 Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke.

2 Dika edeworo ya n'akwukwọ Aisaia onye-amuma, si,
Le, Mu onwem nēzipu onye-ozim ka ọ ga n'iru gi,
Onye gēmezi uzọ-gi;

3 Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si,
Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,
Me okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie;
4 Jọn putara ìhè, onye nēme baptism n'ọhia, nēkwusa kwa baptism nchèghari inwe nb͕aghara nmehie. 5 Ala Judia nile na ndi Jerusalem nile nāpukuru ya; ọ neme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha. 6 Jọn nēyi aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya, nēri kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia. 7 Ọ nēkwusa kwa, si, Onye kam ike nābia n'azum, Onye m'nērughi iruru ala itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya abua.

8 Mu onwem jiri miri me unu baptism; ma Onye ahu geji Mọ Nsọ me unu baptism.
9 O rue na mb͕e ahu, Jisus siri na Nazaret nke Galili bia, Jọn we mee Ya baptism nime Jọdan. 10 Ngwa ngwa mb͕e O si na miri nārigo, Ọ huru elu-igwe ka ha nādọwa, Ọ hu-kwa-ra Mọ Nsọ dika nduru ka Ọ nēfedakwasi Ya:

11 olu we si n'elu-igwe ahu da, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya, ihe-Gi dim ezi nma.
12 Ngwa ngwa Mọ Nsọ we chua Ya ba n'ọhia.

13 O we nọ n'ọhia ọgu ubọchi abua, Setan nānwa Ya; Ya na anu ọhia nile nọ kwa; ndi-mọ-ozi nēje-kwa-ra Ya ozi.
14 Ma mb͕e arasiiri Jọn nye, Jisus biara na Galili, nēkwusa ozi ọma Chineke,

15 si, Oge ezuwo, ala-eze Chineke di kwa nso: chègharianu, kwe-kwa-nu n'ozi ọma.
16 Mb͕e Ọ nāga n'usọ oké osimiri Galili, O we hu Saimon na Andru nwa-nne Saimon ka ha nāwuye úb͕ú n'oké osimiri: n'ihi na ha bu ndi-ọkù. 17 Jisus we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme kwa ka unu buru ndi-ọkù nākuta madu. 18 Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya. 19 Mb͕e Ọ gara n'iru nke-ntà, O we hu Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, ndi nọ kwa n'ub͕ọ, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù.

20 Ngwa ngwa O we kpọ ha: ha we rapu nna-ha Zebedi n'ub͕o, ya na ndi-ọlu egoro ego, ha je so Ya n'azu.
21 Ha we ga ba na Kapanaum; ngwa ngwa O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike we nēzí ihe. 22 Ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru: n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike, ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ. 23 Ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we nọ n'ulo-nzukọ-ha; o we tisie nkpu ike, 24 si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? Amataram gi Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke. 25 Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta. 26 Mọ ahu nādighi ọcha we se ya, were kwa oké olu kpọ nkpu, we si nime ya puta. 27 Ibobo we nwua ha nile n'aru, nke mere ka ha jurita onwe-ha, si, Gini bu nka? ozizí ọhu! ọ bu n'ike ka Ọ nēnye ọbuná ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha nāṅa kwa Ya nti.

28 Ngwa ngwa ewe kọsa akukọ-Ya ebe nile n'ala dum di Galili gburugburu.
29 Ngwa ngwa, mb͕e ha putasiri n'ulo-nzukọ ahu, ha we ba n'ulo Saimon na Andru, ha na Jemes na Jọn. 30 Ma nne nwunye Saimon nēdina n'aru-ọku; ngwa ngwa ha we gwa Ya okwu bayere nwanyi ahu:

31 O we jekuru ya, jide ya n'aka, palie ya; aru-ọku ahu we rapu ya, ọ nējere ha ozi.
32 Ma mb͕e o ruru anyasi, mb͕e anyanwu dara, ha nēkutara Ya ndi aru nādighi nma, na ndi mọ ọjọ ji 33 Obodo ahu dum we zukọ n'ọnu-uzọ.

34 O we me ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi aru nādighi nma n'ọria di iche iche, Ọ chupu kwa ọtutu ndi-mọ ọjọ; O kweghi kwa ndi-mọ ọjọ kwue okwu, n'ihi na ha matara Ya.
35 O we bilie n'isi-ututu, n'ezi abali, pua, je n'ebe bu ọhia, nọ nēkpe ekpere n'ebe ahu. 36 Saimon na ndi ya na ha nọ we b͕aso Ya; 37 ha we chọta Ya, si Ya, Madu nile nāchọ Gi. 38 O we si ha, Ka ayi ga ebe ọzọ n'obodo nile so nka, ka M'kwusa kwa n'ebe ahu; n'ihi na ọ bu ime nka ka M'putara.

39 O we ba n'ulo-nzukọ nile ha gazue na Galili dum, nēkwusa ozi ọma nāchupu kwa ndi-mọ ọjọ.
40 Onye-ekpenta we biakute Ya, nāriọ Ya, nēb͕u-kwa-ra Ya ikperè, nāsi kwa Ya, Ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ocha. 41 O we nwe ọmiko, setipu aka-Ya, metu ya, si ya, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. 42 Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya, eme kwa ka ọ di ọcha. 43 O we dọ ya aka na nti nke-uku, we chupu ya ngwa ngwa, 44 si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu ọ bula: ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha nke Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà. 45 Ma ọ puru, malite ikwusazu ya, na ifesa okwu ahu, nke mere na O nweghi ike ọzọ ibà nime obodo n'iru ọra, kama Ọ nọ n'azu obodo n'ebe bu ọhia: ha we si n'ebe nile nābiakute Ya.

Mark 1

1 The beginning of the gospel of Jesus Christ, the Son of God.2 Even as it is written in Isaiah the prophet, Behold, I send my messenger before thy face, Who shall prepare thy way.3 The voice of one crying in the wilderness, Make ye ready the way of the Lord, Make his paths straight;4 John came, who baptized in the wilderness and preached the baptism of repentance unto remission of sins.5 And there went out unto him all the country of Judaea, and all they of Jerusalem; And they were baptized of him in the river Jordan, confessing their sins.6 And John was clothed with camel’s hair, and had a leathern girdle about his loins, and did eat locusts and wild honey.7 And he preached, saying, There cometh after me he that is mightier than I, the latchet of whose shoes I am not worthy to stoop down and unloose.8 I baptized you in water; But he shall baptize you in the Holy Spirit.9 And it came to pass in those days, that Jesus came from Nazareth of Galilee, and was baptized of John in the Jordan.10 And straightway coming up out of the water, he saw the heavens rent asunder, and the Spirit as a dove descending upon him:11 And a voice came out of the heavens, Thou art my beloved Son, in thee I am well pleased.12 And straightway the Spirit driveth him forth into the wilderness.13 And he was in the wilderness forty days tempted of Satan; And he was with the wild beasts; And the angels ministered unto him.14 Now after John was delivered up, Jesus came into Galilee, preaching the gospel of God,15 and saying, The time is fulfilled, and the kingdom of God is at hand: repent ye, and believe in the gospel.16 And passing along by the sea of Galilee, he saw Simon and Andrew the brother of Simon casting a net in the sea; for they were fishers.17 And Jesus said unto them, Come ye after me, and I will make you to become fishers of men.18 And straightway they left the nets, and followed him.19 And going on a little further, he saw James the son of Zebedee, and John his brother, who also were in the boat mending the nets.20 And straightway he called them: and they left their father Zebedee in the boat with the hired servants, and went after him.21 And they go into Capernaum; and straightway on the sabbath day he entered into the synagogue and taught.22 And they were astonished at his teaching: For he taught them as having authority, and not as the scribes.23 And straightway there was in their synagogue a man with an unclean spirit; and he cried out,24 saying, What have we to do with thee, Jesus thou Nazarene? art thou come to destroy us? I know thee who thou art, the Holy One of God.25 And Jesus rebuked him, saying, Hold thy peace, and come out of him.26 And the unclean spirit, tearing him and crying with a loud voice, came out of him.27 And they were all amazed, insomuch that they questioned among themselves, saying, What is this? a new teaching! with authority he commandeth even the unclean spirits, and they obey him.28 And the report of him went out straightway everywhere into all the region of Galilee round about.29 And straightway, when they were come out of the synagogue, they came into the house of Simon and Andrew, with James and John.30 Now Simon’s wife’s mother lay sick of a fever; and straightway they tell him of her:31 and he came and took her by the hand, and raised her up; and the fever left her, and she ministered unto them.32 And at even, when the sun did set, they brought unto him all that were sick, and them that were possessed with demons.33 And all the city was gathered together at the door.34 And he healed many that were sick with divers diseases, and cast out many demons; and he suffered not the demons to speak, because they knew him.35 And in the morning, a great while before day, he rose up and went out, and departed into a desert place, and there prayed.36 And Simon and they that were with him followed after him;37 and they found him, and say unto him, All are seeking thee.38 And he saith unto them, Let us go elsewhere into the next towns, that I may preach there also; for to this end came I forth.39 And he went into their synagogues throughout all Galilee, preaching and casting out demons.40 And there cometh to him a leper, beseeching him, and kneeling down to him, and saying unto him, If thou wilt, thou canst make me clean.41 And being moved with compassion, he stretched forth his hand, and touched him, and saith unto him, I will; be thou made clean.42 And straightway the leprosy departed from him, and he was made clean.43 And he strictly charged him, and straightway sent him out,44 and saith unto him, See thou say nothing to any man: but go show thyself to the priest, and offer for thy cleansing the things which Moses commanded, for a testimony unto them.45 But he went out, and began to publish it much, and to spread abroad the matter, insomuch that Jesus could no more openly enter into a city, but was without in desert places: and they came to him from every quarter.