MAK 12
1 O we malite igwa ha okwu n'ilu. Otù onye kuru ubi-vine, ọ b͕a ya ogige gburugburu, gwu kwa ebe inara manya agāzọchapu na nkpuru-vine, o wu-kwa-ra ulo-elu, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ. 2 O we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù n'oge ighọ nkpuru, ka ọ nata n'aka ndi-ọlu-ubi nkpuru ufọdu n'ubi-vine-ya. 3 Ha we jide ya, pia ya ihe, zilaga ya n'aka efu. 4 Ọzọ kwa o we zigara ha orù ọzọ; ha we tiwa isi onye ahu, me ya ihe-ihere. 5 O we ziga onye ọzọ; ha we b͕ue onye ahu: na ọtutu ndi ọzọ; ha nāpia ufọdu ihe, nēb͕u kwa ufọdu. 6 O nwere otù onye fọduru, bú ọkpara ọ huru n'anya: o zigara ya ikpe-azu jekuru ha, si, Ha gāsọpuru ọkparam. 7 Ma ndi-ọlu-ubi ahu siritara onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, ihe-nketa-ya gābu kwa nke ayi. 8 Ha we jide ya, b͕ue ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu. 9 Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme? ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ.
10 Ùnu agughi ọbuná ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ;
Nkume nke ndi nēwu ulo juru,
Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:
11 Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere,
Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?
12 Ha we chọ uzọ ijide Ya; ma ha turu egwu ìgwè madu ahu; n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha; ha we rapu Ya, la.
13 Ha we zigara Ye ufọdu nime ndi-Farisi na ndi Herod, ka ha we nwude Ya n'okwu. 14 Ha we bia, si Ya, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru, kama I nēzi uzọ Chineke n'ezi-okwu: ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi? 15 Àyi gātu, ma-ọbu na ayi agaghi-atu? Ma ebe Ọ matara iru-abua-ha; Ọ si ha, Gini mere unu nānwam? wetaram otù shilling, ka M'hu ya. 16 Ha we weta ya. Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya? Ha si Ya, Sisa nwe.
17 Jisus we si ha, Nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke. O we ju ha nile anya nke-uku bayere Ya.
18 Ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n'ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya, si, 19 Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, Ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, rapu nwunye n'azu, ma ọ rapughi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya. 20 Umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nārapughi nkpuru; 21 nke-abua we kuru ya, nwu kwa, ọ rapughi kwa nkpuru n'azu; nke-atọ otú ahu kwa: 22 ndikom asa ahu arapughi nkpuru. N'ikpe-azu ha nile nwanyi ahu nwu-kwa-ra. 23 Na nbilite-n'ọnwu, nwùnye onye n'etiti ha ka ọ gābu? n'ihi na ha asa nwere ya na nwunye. 24 Jisus siri ha, Ọ̀ bughi n'ihi nka ka unu ji hie uzọ, na unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke? 25 N'ihi na mb͕e ha gēsi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di; kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n'elu-igwe. 26 Ma n'okwu bayere ndi nwuru anwu, na anēme ka ha si n'ọnwu bilie; ùnu agughi n'akwukwọ Moses, n'ebe edere okwu bayere Osisi ntà, otú Chineke gwara ya, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob?
27 Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: unu onwe-unu nēhie uzọ nke-uku.
28 Otù onye nime ndi-ode-akwukwọ bia-kwa-ra, we nu ka ha nājurita onwe-ha ajuju, ma ebe ọ matara na Ọ zarari ha nke-ọma, ọ jua Ya, si, Òle nke bu nke-mbu n'ihe nile enyere n'iwu? 29 Jisus zara, si, Nke-mbu bu, Nuru, Israel; Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, Onye-nwe-ayi bu otù: 30 i gāhu kwa Onye-nwe-ayi, bú Chineke-gi, n'anya, site n'obi-gi dum, site kwa na nkpuru-obi-gi dum, site kwa n'uche-gi dum, site kwa n'ike-gi dum. 31 Nke-abua bu nke à, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Ọ dighi ihe ọzọ enyere n'iwu nke dikariri ndia. 32 Ode-akwukwọ ahu we si Ya, Onye-ozizi, n'ezie I kwuru nke-ọma na Ọ bu otù; ọ dighi kwa chi ọzọ di ma-ọbughi Ya: 33 na ihu Ya n'anya site n'obi-gi dum, site kwa na nghọta-gi dum, site kwa n'ike-gi dum, na ihu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, ọ kachasi àjà-nsuresi-ọku nile na àjà ọzọ nile nke-uku.
34 Mb͕e Jisus huru na ọ zara dika onye nwere uche, Ọ si ya, I nọghi ebe di anya n'ala-eze Chineke. Ma ọ dighi onye nwere anya-ike site na mb͕e ahu iju Ya ajuju.
35 Jisus we za, mb͕e Ọ nēzi ihe n'ulo uku Chineke, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid?
36 Devid onwe-ya siri nime Mọ Nsọ,
Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,
Nọdu ala n'aka-nrim,
Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.
37 Devid onwe-ya nākpọ Ya Onye-nwe-ya; òle ebe O si buru kwa Nwa-ya? Oké ìgwè madu ahu we were obi-utọ nu okwu-Ya.
38 N'ozizi-Ya Ọ si kwa, Lezienu anya ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, na inara ekele n'ọma-ahia nile unu, 39 na isi oche nile n'ulo-nzukọ-unu, na isi ọnọdu nile n'oriri nile unu:
40 ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya; ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara ókè kari ndi ọzọ.
41 O we nọdu n'ulo uku Chineke na ncherita-iru ebe anēdebe ùtú anātu, O we nēle otú ìgwè madu nātubà ego n'ebe ùtú ahu: ọtutu ndi bu ọgaranya nātubà kwa ri nne. 42 Otù nwayi, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, we bia, tubà ego ntà abua, nke mere otù farthing. 43 O we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si ha, N'ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ndi nile nātubà nime ebe ùtú ahu: 44 n'ihi na ha nile sitere n'inwebiga-àkù-ókè-ha tubà; ma nwanyi ahu sitere n'ukọ-ya tubà ka ihe nile nke o nwere ra, bú ihe dum o ji biri.
Mark 12
1 And he began to speak unto them in parables. A man planted a vineyard, and set a hedge about it, and digged a pit for the winepress, and built a tower, and let it out to husbandmen, and went into another country.2 And at the season he sent to the husbandmen a servant, that he might receive from the husbandmen of the fruits of the vineyard.3 And they took him, and beat him, and sent him away empty.4 And again he sent unto them another servant; and him they wounded in the head, and handled shamefully.5 And he sent another; and him they killed: and many others; beating some, and killing some.6 He had yet one, a beloved son: he sent him last unto them, saying, They will reverence my son.7 But those husbandmen said among themselves, This is the heir; come, let us kill him, and the inheritance shall be ours.8 And they took him, and killed him, and cast him forth out of the vineyard.9 What therefore will the lord of the vineyard do? he will come and destroy the husbandmen, and will give the vineyard unto others.10 Have ye not read even this scripture: The stone which the builders rejected, The same was made the head of the corner;
11 This was from the Lord, And it is marvellous in our eyes?
12 And they sought to lay hold on him; and they feared the multitude; for they perceived that he spake the parable against them: and they left him, and went away.13 And they send unto him certain of the Pharisees and of the Herodians, that they might catch him in talk.14 And when they were come, they say unto him, Teacher, we know that thou art true, and carest not for any one; for thou regardest not the person of men, but of a truth teachest the way of God: Is it lawful to give tribute unto Caesar, or not?15 Shall we give, or shall we not give? But he, knowing their hypocrisy, said unto them, Why make ye trial of me? bring me a denarius, that I may see it.16 And they brought it. And he saith unto them, Whose is this image and superscription? And they said unto him, Caesar’s.17 And Jesus said unto them, Render unto Caesar the things that are Caesar’s, and unto God the things that are God’s. And they marvelled greatly at him.18 And there come unto him Sadducees, who say that there is no resurrection; and they asked him, saying,19 Teacher, Moses wrote unto us, If a man’s brother die, and leave a wife behind him, and leave no child, that his brother should take his wife, and raise up seed unto his brother.20 There were seven brethren: and the first took a wife, and dying left no seed;21 and the second took her, and died, leaving no seed behind him; and the third likewise:22 and the seven left no seed. Last of all the woman also died.23 In the resurrection whose wife shall she be of them? for the seven had her to wife.24 Jesus said unto them, Is it not for this cause that ye err, that ye know not the scriptures, nor the power of God?25 For when they shall rise from the dead, they neither marry, nor are given in marriage; but are as angels in heaven.26 But as touching the dead, that they are raised; have ye not read in the book of Moses, in the place concerning the Bush, how God spake unto him, saying, I am the God of Abraham, and the God of Isaac, and the God of Jacob?27 He is not the God of the dead, but of the living: ye do greatly err.28 And one of the scribes came, and heard them questioning together, and knowing that he had answered them well, asked him, What commandment is the first of all?29 Jesus answered, The first is, Hear, O Israel; The Lord our God, the Lord is one:30 and thou shalt love the Lord thy God with all thy heart, and with all thy soul, and with all thy mind, and with all thy strength.31 The second is this, Thou shalt love thy neighbor as thyself. There is none other commandment greater than these.32 And the scribe said unto him, Of a truth, Teacher, thou hast well said that he is one; and there is none other but he:33 and to love him with all the heart, and with all the understanding, and with all the strength, and to love his neighbor as himself, is much more than all whole burnt-offerings and sacrifices.34 And when Jesus saw that he answered discreetly, he said unto him, Thou art not far from the kingdom of God. And no man after that durst ask him any question.35 And Jesus answered and said, as he taught in the temple, How say the scribes that the Christ is the son of David?36 David himself said in the Holy Spirit, The Lord said unto my Lord, Sit thou on my right hand, Till I make thine enemies the footstool of thy feet.
37 David himself calleth him Lord; and whence is he his son? And the common people heard him gladly.38 And in his teaching he said, Beware of the scribes, who desire to walk in long robes, and to have salutations in the marketplaces,39 and chief seats in the synagogues, and chief places at feasts:40 they that devour widows’ houses, and for a pretence make long prayers; these shall receive greater condemnation.41 And he sat down over against the treasury, and beheld how the multitude cast money into the treasury: and many that were rich cast in much.42 And there came a poor widow, and she cast in two mites, which make a farthing.43 And he called unto him his disciples, and said unto them, Verily I say unto you, This poor widow cast in more than all they that are casting into the treasury:44 for they all did cast in of their superfluity; but she of her want did cast in all that she had, even all her living.