MAK 2
1 Mb͕e Ọ batara ọzọ na Kapanaum mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, ewe nu na Ọ nọ nime ulo. 2 Otutu madu we zukọ, nke mere na uzọ adighi ọzọ, é-è, ọbuná n'ọnu-uzọ: Ọ nāgwa kwa ha okwu Chineke. 3 Ha we bia, kutara Ya otù onye akuku-aru-ya nwuru anwu, nke madu anọ nēbu. 4 Mb͕e ha apughi ikuru ya biakute Ya n'ihi ìgwè madu, ha we kpupu elu ulo ebe Ọ nọ: mb͕e ha gwupusiri ya, ha we buda ute nke onye akuku-aru-ya nwuru anwu nēdina. 5 Mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, anāb͕aghara gi nmehie-gi nile. 6 Ma ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ nānọdu ala n'ebe ahu, nātule kwa okwu n'obi-ha, 7 si, Gini mere Nwoke a nēkwu okwu otú a? Ọ nēkwulu Chineke: ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke? 8 Ngwa ngwa ebe Jisus mazuru nime mọ-Ya na ha nātule okwu nime onwe-ha otú a, Ọ si ha, Gini mere unu nātule ihe ndia n'obi-unu? 9 Òle nke ka nfe, isi onye akuku-aru-ya nwuru anwu, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, chiri ute-gi, jeghari kwa? 10 Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie, (Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu), 11 M'si gi, Bilie, chiri ute-gi, la n'ulo-gi.
12 O we bilie, chiri ute-ya ngwa ngwa, pua n'iru ha nile; nke mere ka ibobo nwua ha nile n'aru, ha we to Chineke, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula ayi huru ya otú a.
13 O we pua ọzọ ga n'usọ oké osimiri; ìgwè madu ahu nile we nābiakute Ya, Ọ nēzí kwa ha ihe. 14 Mb͕e Ọ nāga, Ọ hu Livai nwa Alfiọs, ka ọ nọduru n'ulọ-ùtú, Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya 15 O rue, na Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, ọtutu ndi ọna-utu na ndi-nmehie so-kwa-ra Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri: n'ihi na ha di ọtutu, ha nēso kwa Ya. 16 Mb͕e ndi-ode-akwukwọ di n'etiti ndi-Farisi huru na O nēso ndi-nmehie na ndi-ọna-utu ahu eri ihe, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, Gini mere Ọ nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ahu eri ihe?
17 Mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma: abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie.
18 Ndi nēso uzọ Jọn na ndi-Farisi nēbu kwa ọnu: ha we bia, si Ya, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ Jọn na ndi nēso uzọ ndi-Farisi nebu ọnu, ma ndi nēso uzọ-Gi adighi-ebu ọnu? 19 Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru ibū ọnu mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ka oge ra ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ ha apughi ibū ọnu. 20 Ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ohu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu n'ubọchi ahu. 21 Ọ dighi onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu dukọta n'uwe ochie: eme otú a, nke kwesiri imechi ya nādọkapu ihe n'aru-ya, nke-ọhu nādọkapu n'aru nke-ochie, ndọka jọkariri njọ aputa.
22 Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, manya-vine gāb͕awa karama-akpukpọ ahu, manya-vine na karama-akpukpọ ala kwa n'iyì: ma anāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu.
23 O rue, na Ọ nāga n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ndi nēso uzọ-Ya we malite ighọ oko ọka mb͕e ha nāga. 24 Ndi-Farisi we si Ya, Le, gini mere ha nēme n'ubọchi-izu-ike ihe nēzighi ezi n'iwu? 25 O we si ha, Ọ dighi mb͕e ọ bula unu guru ihe Devid mere, mb͕e ọ nọ na nkpà, mb͕e agu gu-kwa-ra ya, ya onwe-ya, na ndi soro ya? 26 Otú ọ batara n'ulo Chineke mb͕e Abaiata bu onye-isi-nchu-àjà, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka erie, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ? 27 O we si ha, Emere ubọchi-izu-ike n'ihi madu, emeghi madu n'ihi ubọchi-izu-ike: 28 ya mere Nwa nke madu ji buru kwa Onye-nwe ubọchi-izu-ike.
Mark 2
1 And when he entered again into Capernaum after some days, it was noised that he was in the house.2 And many were gathered together, so that there was no longer room for them, no, not even about the door: and he spake the word unto them.3 And they come, bringing unto him a man sick of the palsy, borne of four.4 And when they could not come nigh unto him for the crowd, they uncovered the roof where he was: and when they had broken it up, they let down the bed whereon the sick of the palsy lay.5 And Jesus seeing their faith saith unto the sick of the palsy, Son, thy sins are forgiven.6 But there were certain of the scribes sitting there, and reasoning in their hearts,7 Why doth this man thus speak? he blasphemeth: who can forgive sins but one, even God?8 And straightway Jesus, perceiving in his spirit that they so reasoned within themselves, saith unto them, Why reason ye these things in your hearts?9 Which is easier, to say to the sick of the palsy, Thy sins are forgiven; or to say, Arise, and take up thy bed, and walk?10 But that ye may know that the Son of man hath authority on earth to forgive sins (he saith to the sick of the palsy),11 I say unto thee, Arise, take up thy bed, and go unto thy house.12 And he arose, and straightway took up the bed, and went forth before them all; insomuch that they were all amazed, and glorified God, saying, We never saw it on this fashion.13 And he went forth again by the sea side; and all the multitude resorted unto him, and he taught them.14 And as he passed by, he saw Levi the son of Alphaeus sitting at the place of toll, and he saith unto him, Follow me. And he arose and followed him.15 And it came to pass, that he was sitting at meat in his house, and many publicans and sinners sat down with Jesus and his disciples: for there were many, and they followed him.16 And the scribes of the Pharisees, when they saw that he was eating with the sinners and publicans, said unto his disciples, How is it that he eateth and drinketh with publicans and sinners?17 And when Jesus heard it, he saith unto them, They that are whole have no need of a physician, but they that are sick: I came not to call the righteous, but sinners.18 And John’s disciples and the Pharisees were fasting: and they come and say unto him, Why do John’s disciples and the disciples of the Pharisees fast, but thy disciples fast not?19 And Jesus said unto them, Can the sons of the bridechamber fast, while the bridegroom is with them? as long as they have the bridegroom with them, they cannot fast.20 But the days will come, when the bridegroom shall be taken away from them, and then will they fast in that day.21 No man seweth a piece of undressed cloth on an old garment: else that which should fill it up taketh from it, the new from the old, and a worse rent is made.22 And no man putteth new wine into old wineskins; else the wine will burst the skins, and the wine perisheth, and the skins: but they put new wine into fresh wine-skins.23 And it came to pass, that he was going on the sabbath day through the grainfields; and his disciples began, as they went, to pluck the ears.24 And the Pharisees said unto him, Behold, why do they on the sabbath day that which is not lawful?25 And he said unto them, Did ye never read what David did, when he had need, and was hungry, he, and they that were with him?26 How he entered into the house of God when Abiathar was high priest, and ate the showbread, which it is not lawful to eat save for the priests, and gave also to them that were with him?27 And he said unto them, The sabbath was made for man, and not man for the sabbath:28 so that the Son of man is lord even of the sabbath.