previous next

MATIU 10

1 O we kpọ ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, O nye ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ, ichupu ha, na igwọ ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.
2 Ma aha ndi-ozi iri na abua ahu bu ndia: Onye mbu, Saimon, onye anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya; na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya; 3 Filip, na Batọlọmiu; Tomas, na Matiu onye-ọna-utu; Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs; 4 Saimon Kananiọs, na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye.

5 Ndikom iri na abua ahu ka Jisus zipuru, O we nye ha iwu, si,
Unu ejela n'uzọ ndi mba ọzọ, unu abà-kwa-la n'obodo ndi Sameria:
6 kama jekurunu aturu furu efu nke ulo Israel. 7 Mb͕e unu nāga, nēkwusanu, si, Ala-eze elu-igwe di nso. 8 Menu ndi aru-ha nādighi ike ka aru di ha ike, menu ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, menu ndi-ekpenta ka ha di ọcha, chupunu ndi-mọ ọjọ: n'efu ka unu natara, nyenu n'efu. 9 Unu anatala ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu ọla itiye n'ihe-ọkiké-unu; 10 unu anatala àkpà iwere ga ije-unu, ma-ọbu uwe-ime abua, ma-ọbu akpukpọ-ukwu, ma-ọbu nkpa-n'aka: n'ihi na onye-ọlu kwesiri ihe eji azù ya. 11 Ma obodo ọ bula ma-ọbu obodo ntà ọ bula unu gābà nime ya, chọputanu onye kwesiri nime ya; nọgidenu n'ebe ahu rue mb͕e unu putara. 12 Mb͕e unu nābà n'ulo ahu, kelenu ya. 13 Ọ buru kwa na ulo ahu kwesiri, ka udo-unu biakwasi ya: ma ọ buru na o kwesighi, ka udo-unu laghachikute unu ọzọ. 14 Ma onye ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, nke nānughi kwa okwu nile unu, mb͕e unu nāpu n'ulo ahu ma-ọbu n'obodo ahu, tichapu ájá ukwu-unu.

15 N'ezie asim unu, Ala Sọdọm na Gọmọra gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari obodo ahu.
16 Le, Mu onwem nēzipu unu dika aturu n'etiti agu: ya mere, burunu ndi nwere uche dika agwọ, ndi nādighi kwa aghughọ dika nduru. 17 Ma nēzenu madu: N'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche, n'ulo-nzukọ nile ha ka ha gāpia kwa unu ihe; 18 e, n'iru ndi-isi na ndi-eze ka agēkuru kwa unu je n'ihim, iburu ha na ndi mba ọzọ àmà. 19 Ma mb͕e ọ bula ha gārara unu nye, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gēkwu ma-ọbu okwu unu gēkwu: n'ihi na agēnye unu n'oge hour ahu okwu unu gēkwu. 20 N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ nke Nna-unu Nke nēkwu nime unu. 21 Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua anwu. 22 Madu nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.

23 Ma mb͕e ọ bula ha sob͕uru unu n'obodo a, b͕alaga n'obodo di iche: n'ihi na n'ezie asim unu, Unu agaghi-agazù obodo nile nke Israel ma-ọli, rue mb͕e Nwa nke madu gābia.
24 Onye nēso uzọ onye-ozizí adighi-aka onye-ozizí-ya, orù adighi-aka kwa onye-nwe-ya. 25 O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku? 26 Ya mere, unu atula egwu ha: n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe; ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama. 27 Okwu M'nāgwa unu n'ọchichiri, kwuenu ya n'ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n'elu ulo. 28 Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n'iyì n'ọku ala-mọ. 29 Àdighi-ere egwele abua n'otù penny? ma otù nime ha agaghi-adà n'ala ma Nna-unu ekwegh: 30 ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. 31 Ya mere, unu atula egwu; ọnu-ahia unu onwe-unu kariri nke ọtutu egwele. 32 Ya mere, onye ọ bula nke gēkwuputam n'iru madu, ya ka Mu onwem gēkwuputa kwa n'iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.

33 Ma onye ọ bula nke gāgọnarim n'iru madu, ya ka Mu onwem gāgọnari kwa n'iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.
34 Unu echèla na abiaram itubà udó n'elu uwa: abiaghm itubà udó, kama ọ bu mma-agha. 35 N'ihi na abiaram ikewa nwoke megide nna-ya, na nwa-nwanyi megide nne-ya, na nwunye nwa megide nne di-ya: 36 ọ bu kwa ndi èzí-na-ulo madu gābu ndi-iro-ya. 37 Onye nāhu nna-ya ma-ọbu nne-ya n'anya kari Mu adighi-ekwesim; onye nāhu kwa nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwanyi n'anya kari Mu adighi-ekwesim. 38 Onye nānaraghi kwa obe-ya sokwam n'azu, adighi-ekwesim.

39 Onye chọtara ndu-ya gētufu ya; onye tufu-kwa-ra ndu-ya n'ihim gāchọta ya.
40 Onye nānara unu nke-ọma, ọ bu Mu ka ọ nānara nke-ọma, onye nānara kwa Mu onwem nke-ọma nānara Onye ziterem nke-ọma. 41 Onye nānara onye-amuma nke-ọma n'aha onye-amuma gānara ugwọ-ọlu onye-amuma; onye nānara kwa onye ezi omume nke-ọma n'aha onye ezi omume gānara ugwọ-ọlu onye ezi omume. 42 Onye ọ bula nke gēkuru nání iko miri oyi nye otù onye nime ndi ntà ndia ṅua n'aha onye nēso uzọm, n'ezie asim unu, ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.

Matthew 10

1 And he called unto him his twelve disciples, and gave them authority over unclean spirits, to cast them out, and to heal all manner of disease and all manner of sickness.

2 Now the names of the twelve apostles are these: The first, Simon, who is called Peter, and Andrew his brother; James the son of Zebedee, and John his brother;3 Philip, and Bartholomew; Thomas, and Matthew the publican; James the son of Alphaeus, and Thaddaeus;4 Simon the Cananaean, and Judas Iscariot, who also betrayed him.

5 These twelve Jesus sent forth, and charged them, saying, Go not into any way of the Gentiles, and enter not into any city of the Samaritans:6 but go rather to the lost sheep of the house of Israel.7 And as ye go, preach, saying, The kingdom of heaven is at hand.8 Heal the sick, raise the dead, cleanse the lepers, cast out demons: freely ye received, freely give.9 Get you no gold, nor silver, nor brass in your purses;10 no wallet for your journey, neither two coats, nor shoes, nor staff: for the laborer is worthy of his food.11 And into whatsoever city or village ye shall enter, search out who in it is worthy; and there abide till ye go forth.12 And as ye enter into the house, salute it.13 And if the house be worthy, let your peace come upon it: but if it be not worthy, let your peace return to you.14 And whosoever shall not receive you, nor hear your words, as ye go forth out of that house or that city, shake off the dust of your feet.15 Verily I say unto you, It shall be more tolerable for the land of Sodom and Gomorrah in the day of judgment, than for that city.

16 Behold, I send you forth as sheep in the midst of wolves: be ye therefore wise as serpents, and harmless as doves.17 But beware of men: for they will deliver you up to councils, and in theirs synagogues they will scourge you;18 yea and before governors and kings shall ye be brought for my sake, for a testimony to them and to the Gentiles.19 But when they deliver you up, be not anxious how or what ye shall speak: for it shall be given you in that hour what ye shall speak.20 For it is not ye that speak, but the Spirit of your Father that speaketh in you.21 And brother shall deliver up brother to death, and the father his child: and children shall rise up against parents, and cause them to be put to death.22 And ye shall be hated of all men for my name’s sake: but he that endureth to the end, the same shall be saved.23 But when they persecute you in this city, flee into the next: for verily I say unto you, Ye shall not have gone through the cities of Israel, till the Son of man be come.

24 A disciple is not above his teacher, nor a servant above his lord.25 It is enough for the disciple that he be as his teacher, and the servant as his lord. If they have called the master of the house Beelzebub, how much more them of his household!26 Fear them not therefore: for there is nothing covered, that shall not be revealed; and hid, that shall not be known.27 What I tell you in the darkness, speak ye in the light; and what ye hear in the ear, proclaim upon the house-tops.28 And be not afraid of them that kill the body, but are not able to kill the soul: but rather fear him who is able to destroy both soul and body in hell.29 Are not two sparrows sold for a penny? and not one of them shall fall on the ground without your Father:30 but the very hairs of your head are all numbered.31 Fear not therefore: ye are of more value than many sparrows.32 Every one therefore who shall confess me before men, him will I also confess before my Father who is in heaven.33 But whosoever shall deny me before men, him will I also deny before my Father who is in heaven.

34 Think not that I came to send peace on the earth: I came not to send peace, but a sword.35 For I came to set a man at variance against his father, and the daughter against her mother, and the daughter in law against her mother in law:36 and a man’s foes shall be they of his own household.37 He that loveth father or mother more than me is not worthy of me; and he that loveth son or daughter more than me is not worthy of me.38 And he that doth not take his cross and follow after me, is not worthy of me.39 He that findeth his life shall lose it; and he that loseth his life for my sake shall find it.

40 He that receiveth you receiveth me, and he that receiveth me receiveth him that sent me.41 He that receiveth a prophet in the name of a prophet shall receive a prophet’s reward: and he that receiveth a righteous man in the name of a righteous man shall receive a righteous man’s reward.42 And whosoever shall give to drink unto one of these little ones a cup of cold water only, in the name of a disciple, verily I say unto you he shall in no wise lose his reward.