previous next

MATIU 18

1 N'oge hour ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus, si, Ònye kwa dikariri uku n'ala-eze elu-igwe? 2 O we kpọ otù nwatakiri biakute Ya, Ọ debe ya n'etiti ha, 3 si, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu echigharighi, bia di ka umu-ntakiri, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli. 4 Ya mere, onye ọ bula nke gēweda onwe-ya dika nwatakiri a, onye ahu dikariri uku n'ala-eze elu-igwe. 5 Ọzọ, onye ọ bula nke gānara otù nwatakiri di otú a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: 6 ma onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwere na Mu ka ọ ma n'ọnyà, ihe gābara ya urù bu ka ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, ka o mìkpu kwa n'ob͕u oké osimiri. 7 Ahuhu gādiri uwa site n'ihe di iche iche nēme ka madu ma n'ọnyà; n'ihi na ọ di nkpà na ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà gābia; ma ahuhu gādiri madu ahu onye ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà nēsite n'aka-ya bia. 8 Ma ọ buru na aka-gi ma-ọbu ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu n'ọlusi ma-ọbu na ngwurọ, kari inwe aka abua ma-ọbu ukwu abua atubà i n'ọku ebighi-ebi. 9 Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, wepu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ. 10 Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n'ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n'elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n'elu-igwe. 11 N'ihi na Nwa nke madu biara izọputa ndi nile furu efu. 12 Gini bu uche-unu? ọ buru na onye ọ bula nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha hie uzọ, ọ̀ dighi-agha ọgu anọ na iri na iteghete ahu, ga ugwu, nāchọ nke ahu hiere uzọ? 13 Ma ọ buru na o nwere ka o si chọta ya, n'ezie asim unu, ọ nāṅuri n'isi ya kari n'isi ọgu anọ na iri na iteghete ahu nēhieghi uzọ.

14 Otú a ọ bughi ihe achọrọ n'iru Nna-unu Nke bi n'elu-igwe, ka otù nime ndi ntà ndia la n'iyì.
15 Ọzọ, ọ buru na nwa-nna-gi emehie megide gi, je, tua ya nmehie-ya n'anya n'etiti nání gi na ya abua: ọ buru na ọ nuru olu-gi, i ritara nwa-nna-gi n'urù. 16 Ma ọ buru na ọ nughi, kuru otù madu ma-ọbu madu abua ọzọ tiyere onwe-gi, ka ewe me okwu ọ bula ekwuru ka o guzo n'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ. 17 Ma ọ buru na ọ ṅaghi ha nti, gwa nzukọm: ma ọ buru na ọ ṅaghi kwa nzukọm nti, ka ọ diri gi ka onye mba ozọ na onye-ọna-utu. 18 N'ezie asim unu, Ka ha ra, bú ihe unu gēke ab͕u n'elu uwa, agēke ha n'elu-igwe: ka ha ra kwa, bú ihe unu gātọpu n'elu uwa, agātọpu ha n'elu-igwe. 19 Ọzọ, asim unu, na ọ buru na madu abua n'etiti unu gēnwe otù olu n'elu uwa bayere ihe ọ bula ha gāriọ, agēme ya nye ha site na Nnam Nke bi n'elu-igwe.

20 N'ihi na ebe madu abua ma-ọbu atọ zukọworo n'aham, n'ebe ahu ka M'nọ n'etiti ha.
21 Mb͕e ahu Pita biakutere Ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, ùb͕ò ole ka nwa-nnam gēmehie megidem, ewem b͕aghara ya? rùe ub͕ò asa? 22 Jisus si ya, Asighm i, Rue ub͕ò asa; kama, Rue ọgu ub͕ò atọ na iri uzọ asa. 23 N'ihi nka ewere ala-eze elu-igwe tuyere otù eze, onye chọrọ ka ya na ndi-orù-ya piazie. 24 Ma mb͕e ọ malitere ipiazi, ewe kutara ya otù onye, nke ji ya orú nnù talent na nnù ise. 25 Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ. 26 Ya mere orù ahu dara n'ala nākpọ isi ala nye ya, si, Onye-nwe-ayi, nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi ihe nile. 27 Ma ebe onye-nwe orù ahu nwere ọmiko n'aru ya, ọ rapu ya, b͕aghara kwa ya ihe ahu o binyere ya-ri. 28 Ma orù ahu puru, hu otù nime ndi-orù-ibe-ya, nke ji ya ọgu shilling ise: o we jidesie ya aka ike, ri ya aka n'akpiri, si, Kwughachim ihe i ji. 29 Ya mere orù-ibe-ya dara n'ala, riọ ya, si, Nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi. 30 Ma ọ chọgh: kama o jere tubà ya n'ulo-nkpọrọ, rue mb͕e ọ gākwughachi ihe o ji. 31 Ya mere mb͕e ndi-orù-ibe-ya huru ihe emere, o wuta ha ri nne n'obi, ha we bia kọrọ onye-nwe-ha ihe nile mere. 32 Mb͕e ahu onye-nwe-ya kpọrọ ya biakute ya, si ya, Ajọ orù, ab͕agharam i ugwọ ahu nile, n'ihi na i riọrọm: 33 ọ̀ kwesighi kwa gi imere orù-ibe-gi ebere ọbuná dika mu onwem mere gi ebere? 34 Onye-nwe-ya were iwe, we rara ya nye n'aka ndi-nmekpa-aru, rue mb͕e ọ gākwughachi ugwọ nile o ji. 35 Otú a ka Nnam nke elu-igwe gēme kwa unu, ọ buru na unu ab͕agharaghi, onye ọ bula nmehie nwa-nne-ya, site n'obi-unu.

Matthew 18

1 In that hour came the disciples unto Jesus, saying, Who then is greatest in the kingdom of heaven?2 And he called to him a little child, and set him in the midst of them,3 and said, Verily I say unto you, Except ye turn, and become as little children, ye shall in no wise enter into the kingdom of heaven.4 Whosoever therefore shall humble himself as this little child, the same is the greatest in the kingdom of heaven.5 And whoso shall receive one such little child in my name receiveth me:6 But whoso shall cause one of these little ones that believe on me to stumble, it is profitable for him that a great millstone should be hanged about his neck, and that he should be sunk in the depth of the sea.

7 Woe unto the world because of occasions of stumbling! for it must needs be that the occasions come; but woe to that man through whom the occasion cometh!8 And if thy hand or thy foot causeth thee to stumble, cut it off, and cast it from thee: it is good for thee to enter into life maimed or halt, rather than having two hands or two feet to be cast into the eternal fire.9 And if thine eye causeth thee to stumble, pluck it out, and cast it from thee: it is good for thee to enter into life with one eye, rather than having two eyes to be cast into the hell of fire.10 See that ye despise not one of these little ones; for I say unto you, that in heaven their angels do always behold the face of my Father who is in heaven.11 For the Son of man came to save that which was lost.12 How think ye? if any man have a hundred sheep, and one of them be gone astray, doth he not leave the ninety and nine, and go unto the mountains, and seek that which goeth astray?13 And if so be that he find it, verily I say unto you, he rejoiceth over it more than over the ninety and nine which have not gone astray.14 Even so it is not the will of your Father who is in heaven, that one of these little ones should perish.

15 And if thy brother sin against thee, go, show him his fault between thee and him alone: if he hear thee, thou hast gained thy brother.16 But if he hear thee not, take with thee one or two more, that at the mouth of two witnesses or three every word may be established.17 And if he refuse to hear them, tell it unto the church: and if he refuse to hear the church also, let him be unto thee as the Gentile and the publican.18 Verily I say unto you, what things soever ye shall bind on earth shall be bound in heaven; and what things soever ye shall loose on earth shall be loosed in heaven.19 Again I say unto you, that if two of you shall agree on earth as touching anything that they shall ask, it shall be done for them of my Father who is in heaven.20 For where two or three are gathered together in my name, there am I in the midst of them.

21 Then came Peter and said to him, Lord, how oft shall my brother sin against me, and I forgive him? until seven times?22 Jesus saith unto him, I say not unto thee, Until seven times; but, Until seventy times seven.23 Therefore is the kingdom of heaven likened unto a certain king, who would make a reckoning with his servants.24 And when he had begun to reckon, one was brought unto him, that owed him ten thousand talents.25 But forasmuch as he had not wherewith to pay, his lord commanded him to be sold, and his wife, and children, and all that he had, and payment to be made.26 The servant therefore fell down and worshipped him, saying, Lord, have patience with me, and I will pay thee all.27 And the lord of that servant, being moved with compassion, released him, and forgave him the debt.28 But that servant went out, and found one of his fellow-servants, who owed him a hundred shillings: and he laid hold on him, and took him by the throat, saying, Pay what thou owest.29 So his fellow-servant fell down and besought him, saying, Have patience with me, and I will pay thee.30 And he would not: but went and cast him into prison, till he should pay that which was due.31 So when his fellow-servants saw what was done, they were exceeding sorry, and came and told unto their lord all that was done.32 Then his lord called him unto him, and saith to him, Thou wicked servant, I forgave thee all that debt, because thou besoughtest me:33 shouldest not thou also have had mercy on thy fellow-servant, even as I had mercy on thee?34 And his lord was wroth, and delivered him to the tormentors, till he should pay all that was due.35 So shall also my heavenly Father do unto you, if ye forgive not every one his brother from your hearts.