MATIU 24
1 Jisus we si n'ulo uku Chineke pua, we nāga n'uzọ-Ya; ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya igosi Ya owuwu-ulo nile nke ulo uku Chineke.
2 Ma Ọ zara, si ha, Ùnu ahughi ihe ndia nile? n'ezie asim unu, Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala.
3 Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a? 4 Jisus we za, si ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu. 5 N'ihi na ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Kraist ahu; ha gēduhie kwa ọtutu madu. 6 Unu gāje inu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche: lenu ka unu ghara itu ujọ: n'ihi na ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi. 7 N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: oké unwu na ala-ọma-jijiji gādi kwa n'ebe di iche iche. 8 Ma ihe ndia nile bu nmalite ihe-nb͕u. 9 Mb͕e ahu ka ha gārara unu nye na nkpab͕u, ha gēb͕u kwa unu: mba nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham. 10 Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì. 11 Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu. 12 N'ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n'anya nke ndi ka n'etiti madu gāju kwa oyi. 13 Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.
14 Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n'elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mb͕e ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa.
15 Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche), 16 mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu: 17 onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya: 18 onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya. 19 Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu. 20 Ma kpenu ekpere ka nb͕apu-unu ghara idi na mb͕e oyi, ma-ọbu n'ubọchi-izu-ike: 21 n'ihi na mb͕e ahu ka nkpab͕u uku gādi, nke ihe dika ya akādighi site na nmalite uwa rue mb͕e a, é-è, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli. 22 Ọ buru kwa na emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara agēme ka ubọchi ahu di nkpirikpi. 23 Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n'ebe a, ma-ọbu, N'ebe a; unu ekwela. 24 N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me. 25 Le, agwawom unu mb͕e akēmeghi ya. 26 Ya mere, ọ buru na ha gāsi unu, Le, Ọ nọ n'ọhia; unu apula: Le, Ọ nọ n'ime-ulo; unu ekwela. 27 N'ihi na dika àmùmà si n'Ọwuwa-anyanwu puta, gosi kwa onwe-ya rue Ọdida-anyanwu; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.
28 Ebe ọ bula ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ.
29 Ma ngwa ngwa, mb͕e nkpab͕u mb͕e ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya, kpakpando nile gāda kwa site n'elu-igwe, agēme kwa ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu: 30 mb͕e ahu ka ihe-iriba-ama nke Nwa nke madu gāputa kwa ìhè n'elu-igwe: mb͕e ahu ka ebo nile nke uwa gēti kwa aka n'obi, ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe n'ike na oké ebube.
31 Ọ gēwere kwa opì uku zipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gēme kwa ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site n'otù nsọtu elu-igwe rue nsọtu-ya ọzọ.
32 Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso; 33 otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia nile, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzọ. 34 N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme. 35 Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli. 36 Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi na oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amataghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara. 37 Ọ bu kwa dika ubọchi Noa diri, otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi. 38 N'ihi na dika ha nọ na mb͕e ahu nke bū oké iju-miri ahu uzọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nālu nwunye, nēnye kwa n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya, 39 ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi. 40 Mb͕e ahu madu abua gānọ n'ubì; ewere otù, rapu kwa otù: 41 ndinyom abua ganēgwe nri na nkume-igwe-nri; ewere otù, rapu kwa otù. 42 Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi ubọchi Onye-nwe-unu gābia. 43 Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-ekwe kwa ka egwupú ulo-ya. 44 N'ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia. 45 Ònye kwa bu orù ahu kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya mere onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha ihe eji azù ha n'oge-ya? 46 Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a. 47 N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere. 48 Ma ọ buru na orù ọjọ ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya; 49 ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndi-orù-ibe-ya aka, so kwa ndi nāṅubiga manya ókè nēri nāṅu kwa; 50 onye-nwe orù ahu gābia n'ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n'oge hour ọ nāmaghi, 51 ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, kè òkè nye ya n'etiti ndi-iru-abua: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.
Matthew 24
1 And Jesus went out from the temple, and was going on his way; and his disciples came to him to show him the buildings of the temple.2 But he answered and said unto them, See ye not all these things? verily I say unto you, There shall not be left here one stone upon another, that shall not be thrown down.
3 And as he sat on the mount of Olives, the disciples came unto him privately, saying, Tell us, when shall these things be? and what shall be the sign of thy coming, and of the end of the world?4 And Jesus answered and said unto them, Take heed that no man lead you astray.5 For many shall come in my name, saying, I am the Christ; and shall lead many astray.6 And ye shall hear of wars and rumors of wars; see that ye be not troubled: for these things must needs come to pass; but the end is not yet.7 For nation shall rise against nation, and kingdom against kingdom; and there shall be famines and earthquakes in divers places.8 But all these things are the beginning of travail.9 Then shall they deliver you up unto tribulation, and shall kill you: and ye shall be hated of all the nations for my name’s sake.10 And then shall many stumble, and shall deliver up one another, and shall hate one another.11 And many false prophets shall arise, and shall lead many astray.12 And because iniquity shall be multiplied, the love of the many shall wax cold.13 But he that endureth to the end, the same shall be saved.14 And this gospel of the kingdom shall be preached in the whole world for a testimony unto all the nations; and then shall the end come.
15 When therefore ye see the abomination of desolation, which was spoken of through Daniel the prophet, standing in the holy place (let him that readeth understand),16 then let them that are in Judaea flee unto the mountains:17 let him that is on the housetop not go down to take out things that are in his house:18 and let him that is in the field not return back to take his cloak.19 But woe unto them that are with child and to them that give suck in those days!20 And pray ye that your flight be not in the winter, neither on a sabbath:21 for then shall be great tribulation, such as hath not been from the beginning of the world until now, no, nor ever shall be.22 And except those days had been shortened, no flesh would have been saved: but for the elect’s sake those days shall be shortened.23 Then if any man shall say unto you, Lo, here is the Christ, or, Here; believe it not.24 For there shall arise false Christs, and false prophets, and shall show great signs and wonders; so as to lead astray, if possible, even the elect.25 Behold, I have told you beforehand.26 If therefore they shall say unto you, Behold, he is in the wilderness; go not forth: Behold, he is in the inner chambers; believe it not.27 For as the lightning cometh forth from the east, and is seen even unto the west; so shall be the coming of the Son of man.28 Wheresoever the carcase is, there will the eagles be gathered together.
29 But immediately after the tribulation of those days the sun shall be darkened, and the moon shall not give her light, and the stars shall fall from heaven, and the powers of the heavens shall be shaken:30 and then shall appear the sign of the Son of man in heaven: and then shall all the tribes of the earth mourn, and they shall see the Son of man coming on the clouds of heaven with power and great glory.31 And he shall send forth his angels with a great sound of a trumpet, and they shall gather together his elect from the four winds, from one end of heaven to the other.
32 Now from the fig tree learn her parable: when her branch is now become tender, and putteth forth its leaves, ye know that the summer is nigh;33 even so ye also, when ye see all these things, know ye that he is nigh, even at the doors.34 Verily I say unto you, This generation shall not pass away, till all these things be accomplished.35 Heaven and earth shall pass away, but my words shall not pass away.36 But of that day and hour knoweth no one, not even the angels of heaven, neither the Son, but the Father only.37 And as were the days of Noah, so shall be the coming of the Son of man.38 For as in those days which were before the flood they were eating and drinking, marrying and giving in marriage, until the day that Noah entered into the ark,39 and they knew not until the flood came, and took them all away; so shall be the coming of the Son of man.40 Then shall two man be in the field; one is taken, and one is left:41 two women shall be grinding at the mill; one is taken, and one is left.42 Watch therefore: for ye know not on what day your Lord cometh.43 But know this, that if the master of the house had known in what watch the thief was coming, he would have watched, and would not have suffered his house to be broken through.44 Therefore be ye also ready; for in an hour that ye think not the Son of man cometh.
45 Who then is the faithful and wise servant, whom his lord hath set over his household, to give them their food in due season?46 Blessed is that servant, whom his lord when he cometh shall find so doing.47 Verily I say unto you, that he will set him over all that he hath.48 But if that evil servant shall say in his heart, My lord tarrieth;49 and shall begin to beat his fellow-servants, and shall eat and drink with the drunken;50 the lord of that servant shall come in a day when he expecteth not, and in an hour when he knoweth not,51 and shall cut him asunder, and appoint his portion with the hypocrites: there shall be the weeping and the gnashing of teeth.