previous next

MATIU 28

1 Ma mb͕e ubọchi-izu-ike nāgwu, mb͕e chi ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa nābọ, Meri Magdalini na Meri ọzọ biara ile ílì ahu. 2 Ma le, ala-ọma-jijiji uku dara; n'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi si n'elu-igwe ridata, bia rue, bupu nkume ahu, we nọkwasi ya. 3 Oyiyi-ya di ka àmùmà, uwe-ya nācha kwa ucha dika snow: 4 site n'egwu ya ndi-nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu. 5 Ma mọ-ozi ahu zara, si ndinyom ahu, Unu onwe-unu atula egwu: n'ihi na amatawom na unu nāchọ Jisus, Onye akpọgideworo n'obe. 6 Ọ nọghi n'ebe a; n'ihi na emere ka O si n'ọnwu bilie, dika O kwuru. Bianu, le ebe Ọ tọb͕ọrọ. 7 Ga-kwa-nu ọsọsọ, si ndi nēso uzọ-Ya, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; ma le, O buru unu uzọ ga Galili; n'ebe ahu ka unu gāhu Ya: le, agwawom unu. 8 Ha we were egwu na oké ọṅù la ọsọsọ site n'ílì ahu, b͕a kwa ọsọ ikọrọ ndi nēso uzọ-Ya akukọ a. 9 Ma le, Jisus zutere ha, si, Ṅurianu ọṅu. Ha we bia jide ukwu-Ya abua, kpọ isi ala nye Ya.

10 Mb͕e ahu Jisus si ha, Unu atula egwu: jenu kọrọ umu-nnam ka ha je Galili, n'ebe ahu ka ha gāhukwam.
11 Ma mb͕e ha nāga, le, ufọdu nime òtù ndi-nche batara n'obodo ahu, kọrọ ndi-isi-nchu-àjà ihe nile mere. 12 Mb͕e ha na ndi-okenye zukọrọ, b͕a kwa ìzù, ha we nye ndi-agha ahu ego riri nne, 13 si, Sinu, Ndi nēso uzọ-Ya biara n'abali, zuru Ya n'ori mb͕e ayi nāraru ura. 14 Ọ buru kwa na nka ruru nti onye-isi, ayi onwe-ayi gārafu ya, me ka unu ghara icheb͕u onwe-unu.

15 Ha we nara ego ahu, me dika eziri ha: ewe b͕asa okwu a n'etiti ndi-Ju, rue ta.
16 Ma ndikom iri na otù ahu ndi nēso uzọ-Ya gara Galili, rue ugwu ebe Jisus gwara ha. 17 Mb͕e ha huru Ya, ha we kpọ isi ala nye Ya: ma ufọdu nwere obi abua. 18 Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem. 19 Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ: 20 nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.

Matthew 28

1 Now late on the sabbath day, as it began to dawn toward the first day of the week, came Mary Magdalene and the other Mary to see the sepulchre.2 And behold, there was a great earthquake; for an angel of the Lord descended from heaven, and came and rolled away the stone, and sat upon it.3 His appearance was as lightning, and his raiment white as snow:4 and for fear of him the watchers did quake, and became as dead men.5 And the angel answered and said unto the women, Fear not ye; for I know that ye seek Jesus, who hath been crucified.6 He is not here; for he is risen, even as he said. Come, see the place where the Lord lay.7 And go quickly, and tell his disciples, He is risen from the dead; and lo, he goeth before you into Galilee; there shall ye see him: lo, I have told you.8 And they departed quickly from the tomb with fear and great joy, and ran to bring his disciples word.9 And behold, Jesus met them, saying, All hail. And they came and took hold of his feet, and worshipped him.10 Then saith Jesus unto them, Fear not: go tell my brethren that they depart into Galilee, and there shall they see me.

11 Now while they were going, behold, some of the guard came into the city, and told unto the chief priests all the things that were come to pass.12 And when they were assembled with the elders, and had taken counsel, they gave much money unto the soldiers,13 saying, Say ye, His disciples came by night, and stole him away while we slept.14 And if this come to the governor’s ears, we will persuade him, and rid you of care.15 So they took the money, and did as they were taught: and this saying was spread abroad among the Jews, and continueth until this day.

16 But the eleven disciples went into Galilee, unto the mountain where Jesus had appointed them.17 And when they saw him, they worshipped him; but some doubted.18 And Jesus came to them and spake unto them, saying, All authority hath been given unto me in heaven and on earth.19 Go ye therefore, and make disciples of all the nations, baptizing them into the name of the Father and of the Son and of the Holy Spirit:20 teaching them to observe all things whatsoever I commanded you: and lo, I am with you always, even unto the end of the world.