previous next

MATIU 4

1 Mb͕e ahu Mọ Nsọ duru Jisus rigo n'ọhia ka ekwensu we nwa Ya. 2 Mb͕e O busiri ọnu ọgu ubọchi abua ehihie na abali, emesia agu guru Ya. 3 Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha. 4 Ma Ọ zara, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu okwu nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Chineke puta. 5 Mb͕e ahu ekwensu kuru Ya bà n'obodo nsọ; o we guzo Ya n'elu akuku ulo uku Chineke,

6 si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, tudà Onwe-gi n'ala: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,
Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi:
Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi,
Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya.
7 Jisus siri ya, Ọzọ kwa edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi. 8 Ọzọ kwa, ekwensu kuru Ya ga ugwu di oké elu, we gosi Ya ala-eze nile nke uwa, na ebube-ha; 9 o we si Ya, Ihe ndia nile ka m'gēnye Gi, ọ buru na I gādà n'ala kpọ isi ala nyem. 10 Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.

11 Mb͕e ahu ekwensu rapu Ya; ma le, ndi-mọ-ozi biakutere Ya nējere Ya ozi.
12 Ma mb͕e Ọ nuru na arara Jọn nye, O wezugara Onwe-ya je Galili; 13 O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n'usọ osimiri, n'ókè-ala Zebulun na Naftali:

14 ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,

15 Ala Zebulun na ala Naftali,
N'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan,
Galili nke ndi-mba ọzọ,

16 Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiri
Huru oké ìhè,
Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu,
Ndia ka ìhè walitere.

17 Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.
18 Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù. 19 O we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme unu ndi-ọkù nākuta madu. 20 Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya. 21 O we si n'ebe ahu ga, hu umu-nne abua ọzọ, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, nime ub͕ọ-ha, ha na nna-ha Zebedi, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù; O we kpọ ha.

22 Ngwa ngwa ha we rapu ub͕ọ ahu na nna-ha, so Ya.
23 Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n'etiti ndi ahu. 24 Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike. 25 Ọtutu ìgwè madu we si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n'ofè Jọdan so Ya.

Matthew 4

1 Then was Jesus led up of the Spirit into the wilderness to be tempted of the devil.2 And when he had fasted forty days and forty nights, he afterward hungered.3 And the tempter came and said unto him, If thou art the Son of God, command that these stones become bread.4 But he answered and said, It is written, Man shall not live by bread alone, but by every word that proceedeth out of the mouth of God.5 Then the devil taketh him into the holy city; and he set him on the pinnacle of the temple,6 and saith unto him, If thou art the Son of God, cast thyself down: for it is written, He shall give his angels charge concerning thee: and, On their hands they shall bear thee up, Lest haply thou dash thy foot against a stone.

7 Jesus said unto him, Again it is written, Thou shalt not make trial of the Lord thy God.8 Again, the devil taketh him unto an exceeding high mountain, and showeth him all the kingdoms of the world, and the glory of them;9 and he said unto him, All these things will I give thee, if thou wilt fall down and worship me.10 Then saith Jesus unto him, Get thee hence, Satan: for it is written, Thou shalt worship the Lord thy God, and him only shalt thou serve.11 Then the devil leaveth him; and behold, angels came and ministered unto him.

12 Now when he heard that John was delivered up, he withdrew into Galilee;13 and leaving Nazareth, he came and dwelt in Capernaum, which is by the sea, in the borders of Zebulun and Naphtali:14 that it might be fulfilled which was spoken through Isaiah the prophet, saying,

15 The land of Zebulun and the land of Naphtali, Toward the sea, beyond the Jordan, Galilee of the Gentiles,

16 The people that sat in darkness Saw a great light, And to them that sat in the region and shadow of death, To them did light spring up.

17 From that time began Jesus to preach, and to say, Repent ye; for the kingdom of heaven is at hand.

18 And walking by the sea of Galilee, he saw two brethren, Simon who is called Peter, and Andrew his brother, casting a net into the sea; for they were fishers.19 And he saith unto them, Come ye after me, and I will make you fishers of men.20 And they straightway left the nets, and followed him.21 And going on from thence he saw two other brethren, James the son of Zebedee, and John his brother, in the boat with Zebedee their father, mending their nets; and he called them.22 And they straightway left the boat and their father, and followed him.

23 And Jesus went about in all Galilee, teaching in their synagogues, and preaching the gospel of the kingdom, and healing all manner of disease and all manner of sickness among the people.24 And the report of him went forth into all Syria: and they brought unto him all that were sick, holden with divers diseases and torments, possessed with demons, and epileptic, and palsied; and he healed them.25 And there followed him great multitudes from Galilee and Decapolis and Jerusalem and Judaea and from beyond the Jordan.