previous next

MATIU 7

1 Unu ekpela ikpé, ka aghara ikpe unu ikpé. 2 N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu. 3 Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n'anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n'anya nke gi? 4 Ma-ọbu ì gēsi aṅa si nwa-nna-gi, Kwe ka m'tupu irighiri ahihia ahu n'anya-gi: ma le, ntuhie ahu di n'anya nke gi?

5 Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n'anya nke gi; mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu n'anya nwa-nna-gi.

6 Unu enyela nkita ihe di nsọ, unu atuda-kwa-la pearl-unu n'iru ezì, ka ha ghara izọkwasi ha n'ukwu-ha ma eleghi anya, we chigharia, dọka unu.
7 Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu: 8 n'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere. 9 Ma -ọbu òle madu di n'etiti unu, onye, ma ọ buru na nwa-ya gāriọ ya ob͕e achicha, gēnye ya nkume; 10 ma-ọbu asi na ọ gāriọ azù, gēnye ya agwọ? 11 Ya mere, ọ buru na unu onwe unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu Nke bi n'elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari ezi ihe nke-uku nye ndi nāriọ Ya?

12 Ya mere ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n'ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke.
13 Sinu n'ọnu-uzọ di warara bà: n'ihi na obosara ka ọnu-uzọ ahu di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà n'ila-n'iyì, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà.

14 N'ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya.
15 Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n'ihe-oyiyi aturu, ma n'ime ha bu agu nāpunara aturu. 16 Unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha. Màdu nēkpokọputa nkpuru-vine n'ogwu, ma-obu fig n'uké? 17 Otú a ezi osisi ọ bula nāmi nkpuru ọma; ma osisi nābaghi n'ihe nāmi ajọ nkpuru. 18 Ezi osisi apughi imi ajọ nkpuru, osisi nābaghi n'ihe apughi kwa imi nkpuru ọma. 19 Anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku. 20 Ya mere unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha. 21 Ọ bughi onye ọ bula nke nāsim, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, gābà n'ala eze elu-igwe; kama ọ bu onye nēme ihe Nnam Nke bi n'elu-igwe nāchọ. 22 Ọtutu madu gāsim n'ubọchi ahu, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, àyi jiri aha-Gi bu amuma, àyi jiri kwa aha-Gi chupu ndi-mọ ọjọ, àyi jiri kwa aha-Gi lu ọtutu ọlu di ike? 23 Ma mb͕e ahu ka M'gēkwuputara ha, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula M'mara unu: si n'ebe M'nọ pua, unu ndi nālu ọlu nēmebi iwu. 24 Ya mere onye ọ bula nke nānu okwum ndia, nēme kwa ha, agēji ya tuyere nwoke nwere uche, onye wuru ulo-ya n'elu oké nkume: 25 miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we makwasi ulo ahu; ma ọ dagh: n'ihi na atọrọ ntọ-ala-ya n'elu oké nkume ahu. 26 Ma onye ọ bula nke nānu okwum ndia, ma ọ dighi-eme ha, agēji ya tuyere nwoke nke bu onye-nzuzu, onye wuru ulo-ya n'elu ájá:

27 miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we tikwasi ulo ahu; o we da: ọdida-ya di kwa uku.
28 O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n'aru: 29 n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ-ha.

Matthew 7

1 Judge not, that ye be not judged.2 For with what judgment ye judge, ye shall be judged: and with what measure ye mete, it shall be measured unto you.3 And why beholdest thou the mote that is in thy brother’s eye, but considerest not the beam that is in thine own eye?4 Or how wilt thou say to thy brother, Let me cast out the mote out of thine eye; and lo, the beam is in thine own eye?5 Thou hypocrite, cast out first the beam out of thine own eye; and then shalt thou see clearly to cast out the mote out of thy brother’s eye.

6 Give not that which is holy unto the dogs, neither cast your pearls before the swine, lest haply they trample them under their feet, and turn and rend you.

7 Ask, and it shall be given you; seek, and ye shall find; knock, and it shall be opened unto you:8 for every one that asketh receiveth; and he that seeketh findeth; and to him that knocketh it shall be opened.9 Or what man is there of you, who, if his son shall ask him for a loaf, will give him a stone;10 or if he shall ask for a fish, will give him a serpent?11 If ye then, being evil, know how to give good gifts unto your children, how much more shall your Father who is in heaven give good things to them that ask him?12 All things therefore whatsoever ye would that men should do unto you, even so do ye also unto them: for this is the law and the prophets.

13 Enter ye in by the narrow gate: for wide is the gate, and broad is the way, that leadeth to destruction, and many are they that enter in thereby.14 For narrow is the gate, and straitened the way, that leadeth unto life, and few are they that find it.

15 Beware of false prophets, who come to you in sheep’s clothing, but inwardly are ravening wolves.16 By their fruits ye shall know them. Do men gather grapes of thorns, or figs of thistles?17 Even so every good tree bringeth forth good fruit; but the corrupt tree bringeth forth evil fruit.18 A good tree cannot bring forth evil fruit, neither can a corrupt tree bring forth good fruit.19 Every tree that bringeth not forth good fruit is hewn down, and cast into the fire.20 Therefore by their fruits ye shall know them.21 Not every one that saith unto me, Lord, Lord, shall enter into the kingdom of heaven; but he that doeth the will of my Father who is in heaven.22 Many will say to me in that day, Lord, Lord, did we not prophesy by thy name, and by thy name cast out demons, and by thy name do many mighty works?23 And then will I profess unto them, I never knew you: depart from me, ye that work iniquity.

24 Every one therefore that heareth these words of mine, and doeth them, shall be likened unto a wise man, who built his house upon the rock:25 and the rain descended, and the floods came, and the winds blew, and beat upon that house; and if fell not: for it was founded upon the rock.26 And every one that heareth these words of mine, and doeth them not, shall be likened unto a foolish man, who built his house upon the sand:27 and the rain descended, and the floods came, and the winds blew, and smote upon that house; and it fell: and great was the fall thereof.

28 And it came to pass, when Jesus had finished these words, the multitudes were astonished at his teaching:29 for he taught them as one having authority, and not as their scribes.