previous next

NDI FILIPAI 1

1 Pọl na Timọti, ndi-orù nke Kraist Jisus, nēdegara ndi nsọ nile nime Kraist Jisus ndi nọ na Filipai akwukwọ, ha na ndi nēlekọta unu anya na ndi nējere unu ozi:

2 Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
3 Anamekele Chinekem na ncheta nile m'nēcheta unu, 4 mb͕e nile n'aririọ nile m'nāriọrọ unu nile nāriọ aririọ ahu nime ọṅù, 5 n'ihi nnwekọ unu nwekọrọ n'izisa ozi ọma site n'ubọchi mbu rue ub͕u a; 6 ebe m'tukwasiworo obim n'otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist: 7 dika o ziri ezi ka m'tukwasi uchem n'ihe a bayere unu nile, n'ihi na enwerem unu n'obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n'inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike. 8 N'ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n'obi-ebere nke Kraist Jisus. 9 Nka ka m'nēkpe kwa ekpere, ka ihu-n'anya-unu we nābabiga kwa ókè kari nke-uku nime nmazu na nghọta nile; 10 ka unu we nwa ihe ha na ibe-ha di iche; ka unu we di ọcha n'obi ghara kwa isu ngọngọ rue ubọchi nke Kraist;

11 ebe unu gābu ndi juputaworo na nkpuru nke ezi omume, nke sitere n'aka Jisus Kraist, ka Chineke we nwe ebube na otuto.
12 Ma anamezube ka unu mara, umu-nnam, na, kama ihe ọzọ, ọnọdum emewo ka ozi ọma ga n'iru; 13 ya mere ab͕um putara ìhè nime Kraist na Pritoriọm dum, ya na n'ebe ndi nile fọduru nọ; 14 o me kwa ka ndi ka n'ọnu-ọgugu n'etiti umu-nna nime Onye-nwe-ayi nwebiga anya-ike ókè ikwu okwu Chineke nātughi egwu, ebe ha tukwasiworo obi site n'ab͕um. 15 Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n'ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n'ihi na ọ di ha ezi nma: 16 ndia nēme ya site n'ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m'we gọpu ozi ọma: 17 ma ndi ahu nēkwusa Kraist-ayi site n'ikpa-iche-iche, ọ bughi n'idi-ọcha-n'obi, ebe ha nēchè na ha gēwelirim nkpab͕u n'ab͕um. 18 Gini kwa? ọ bu nání na n'uzọ ọ bula, ma ọ bu n'aghughọ ma-ọbu n'ezi-okwu, anēkwusa Kraist; nime nka ka m'nāṅuri kwa ọṅu, e, m'gāṅuri kwa ọṅu nime ya. 19 N'ihi na amataram na nka gēme ka m'nwe nzọputa, site n'aririọ-unu na nnyezu nke Mọ nke Jisus Kraist, 20 dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile. 21 N'ihi na n'ebe m'nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa urù. 22 Ma ọ buru na idi ndu n'anu-aru bu òkèm, nka bu nkpuru nke ọlum: ihe m'gārọputa kwa amaghi m. 23 Ma anọm n'ebe di nkpà n'etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n'ebe Kraist nọ nāgum; n'ihi na ọ kachasi nma nke-uku: 24 ma inọgide n'anu-aru dikariri nkpà n'ihi unu. 25 Ebe m'tukwasiworo obi m n'ihe a, amataram na m'gānọgide, nọgide kwa n'etiti unu nile, ime ka unu ga n'iru ṅu kwa ọṅù nke okwukwe; 26 ka inya-isi-unu we babiga ókè nime Kraist Jisus n'arum site n'ọbibia m'gābiakute unu ọzọ. 27 Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike; 28 ghara ikwe ka ndi nēmegide unu me ka unu tua ujọ n'ihe ọ bula: ebe nke ahu bu ihe nēme ka ila-n'iyì putara ha ìhè, ma ọ nēme ka nzọputa-unu puta ìhè, nka site-kwa-ra na Chineke; 29 n'ihi na unu ka enyeworo ya n'amara n'ihi Kraist, ọ bughi nání ikwere na Ya, kama ihu kwa ahuhu n'ihi Ya: 30 ebe unu nwere otù nb͕a ahu nke unu huru n'arum, ub͕u a ka unu nānu kwa na ọ di n'arum.

Philippians 1

1 Paul and Timothy, servants of Christ Jesus, to all the saints in Christ Jesus that are at Philippi, with the bishops and deacons:2 Grace to you and peace from God our Father and the Lord Jesus Christ.3 I thank my God upon all my remembrance of you,4 always in every supplication of mine on behalf of you all making my supplication with joy,5 for your fellowship in furtherance of the gospel from the first day until now;6 being confident of this very thing, that he who began a good work in you will perfect it until the day of Jesus Christ:7 even as it is right for me to be thus minded on behalf of you all, because I have you in my heart, inasmuch as, both in my bonds and in the defence and confirmation of the gospel, ye all are partakers with me of grace.8 For God is my witness, how I long after you all in the tender mercies of Christ Jesus.9 And this I pray, that your love may abound yet more and more in knowledge and all discernment;10 so that ye may approve the things that are excellent; that ye may be sincere and void of offence unto the day of Christ;11 being filled with the fruits of righteousness, which are through Jesus Christ, unto the glory and praise of God.12 Now I would have you know, brethren, that the things which happened unto me have fallen out rather unto the progress of the gospel;13 so that my bonds became manifest in Christ throughout the whole praetorian guard, and to all the rest;14 and that most of the brethren in the Lord, being confident through my bonds, are more abundantly bold to speak the word of God without fear.15 Some indeed preach Christ even of envy and strife; and some also of good will:16 the one do it of love, knowing that I am set for the defence of the gospel;17 but the other proclaim Christ of faction, not sincerely, thinking to raise up affliction for me in my bonds.18 What then? only that in every way, whether in pretence or in truth, Christ is proclaimed; and therein I rejoice, yea, and will rejoice.19 For I know that this shall turn out to my salvation, through your supplication and the supply of the Spirit of Jesus Christ,20 according to my earnest expectation and hope, that in nothing shall I be put to shame, but that with all boldness, as always, so now also Christ shall be magnified in my body, whether by life, or by death.21 For to me to live is Christ, and to die is gain.22 But if to live in the flesh, --if this shall bring fruit from my work, then what I shall choose I know not.23 But I am in a strait betwixt the two, having the desire to depart and be with Christ; for it is very far better:24 yet to abide in the flesh is more needful for your sake.25 And having this confidence, I know that I shall abide, yea, and abide with you all, for your progress and joy in the faith;26 that your glorying may abound in Christ Jesus in me through my presence with you again.27 Only let your manner of life be worthy of the gospel of Christ: that, whether I come and see you and be absent, I may hear of your state, that ye stand fast in one spirit, with one soul striving for the faith of the gospel;28 and in nothing affrighted by the adversaries: which is for them an evident token of perdition, but of your salvation, and that from God;29 because to you it hath been granted in the behalf of Christ, not only to believe on him, but also to suffer in his behalf:30 having the same conflict which ye saw in me, and now hear to be in me.