previous next

NKPUGHE 16

1 M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'ulo nsọ ahu dà, nāsi ndi-mọ-ozi asa ahu, Jenu, wusi ọkwa asa ahu nke ọnuma Chineke nime uwa.

2 Mọ-ozi mbu we je, wusi ọkwa-ya nime uwa; ajọ ọnyá jọb͕uru onwe-ya we puta n'aru madu nile ndi nwere akàrà anu-ọhia ahu, ndi nākpọ kwa isi ala nye ihe-oyiyi-ya.

3 Mọ-ozi nke-abua we wusi ọkwa-ya nime oké osimiri; o we ghọ ọbara dika nke madu nwuru anwu; nkpuru-obi nile ọ bula nke di ndu we nwua, bú ihe di n'oké osimiri.
4 Mọ-ozi nke-atọ we wusi ọkwa-ya nime osimiri nile na isi-iyi nile nke miri nile; miri ahu we ghọ ọbara. 5 M'we nu mọ-ozi miri nile ka ọ nāsi, Onye ezi omume ka I bu, Gi Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye di ọcha n'obi, n'ihi na I kpere ikpé ndia: 6 n'ihi na ha wusiri ọbara ndi nsọ na ndi-amuma, ọbara ka I nyewo-kwa-ra ha ka ha ṅua: ha bu ndi kwesiri ekwesi.

7 M'we nu ebe-ichu-àjà ahu ka ọ nāsi, E, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, ikpé-Gi nile bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi.
8 Mọ-ozi nke-anọ we wusi ọkwa-ya n'elu anyanwu; ewe nye ya ike iji ọku chab͕u madu.

9 Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto.
10 Mọ-ozi nke-ise we wusi ọkwa-ya n'elu oche-eze nke anu-ọhia ahu; ewe me ka ala-eze-ya b͕a ọchichiri; ha we tabìe ire-ha site n'aru-ufu,

11 ha we kwulu Chineke nke elu-igwe site n'aru-ufu nile ha na ọnyá nile ha; ha echègharighi kwa isi n'ọlu nile ha puta.
12 Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n'elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n'ọwūwa-anyanwu bia. 13 M'we hu ndi-mọ atọ nādighi ọcha, dika awọ̀, ka ha nēsi n'ọnu dragon ahu, si kwa n'ọnu anu-ọhia ahu, si kwa n'ọnu onye-amuma ugha ahu, puta: 14 n'ihi na ha bu mọ nke ndi-mọ ọjọ, nēme ihe-iriba-ama di iche iche; ndi nāpukuru ndi-eze nke elu-uwa dum madu bi, ime ka ha zukọ ibu agha nke oké ubọchi ahu nke Chineke, Onye puru ime ihe nile. 15 (Le, anamabia dika onye-ori. Ngọzi nādiri onye nēche nche, nēdebe kwa uwe-ya, ka ọ ghara ijeghari n'ọtọ, ha we hu ihere-ya.)

16 Ha we me ka ha zukọ n'ebe ahu nke anākpọ n'asusu Hibru Amagedọn.
17 Mọ-ozi nke-asa we wusi ọkwa-ya n'elu mbara-elu-igwe; oké olu we si n'ulo nsọ ahu daputa, si n'ebe oche-eze ahu di, nāsi, Emewo ya: 18 àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, we so; oké ala-ọma-jijiji so-kwa-ra, nke ala-ọma-jijiji di otú a adaghi mb͕e ọ bula site na mb͕e madu putara n'elu uwa, ala-ọma-jijiji di uku otú a, oké ala-ọma-jijiji di otú a. 19 Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n'iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya. 20 Agwe-etiti nile ọ bula we b͕alaga, ahughi kwa ugwu nile ọzọ. 21 Oké ákú-miri-ígwé, nke ra ka talent n'arọ́ n'otù, nēsi kwa n'elu-igwe ridata n'aru madu: madu we kwulu Chineke site n'ihe-otiti nke ákú-miri-ígwé ahu; n'ihi na ihe-otiti-ya di uku ri nne.

Revelation 16

1 And I heard a great voice out of the temple, saying to the seven angels, Go ye, and pour out the seven bowls of the wrath of God into the earth.2 And the first went, and poured out his bowl into the earth; and it became a noisome and grievous sore upon the men that had the mark of the beast, and that worshipped his image.3 And the second poured out his bowl into the sea; and it became blood as of a dead man; and every living soul died, even the things that were in the sea.4 And the third poured out his bowl into the rivers and the fountains of the waters; and it became blood.5 And I heard the angel of the waters saying, Righteous art thou, who art and who wast, thou Holy One, because thou didst thus judge:6 for they poured out the blood of the saints and the prophets, and blood hast thou given them to drink: they are worthy.7 And I heard the altar saying, Yea, O Lord God, the Almighty, true and righteous are thy judgments.8 And the fourth poured out his bowl upon the sun; and it was given unto it to scorch men with fire.9 And men were scorched men with great heat: and they blasphemed the name of God who hath the power over these plagues; and they repented not to give him glory.10 And the fifth poured out his bowl upon the throne of the beast; and his kingdom was darkened; and they gnawed their tongues for pain,11 and they blasphemed the God of heaven because of their pains and their sores; and they repented not of their works.12 And the sixth poured out his bowl upon the great river, the river Euphrates; and the water thereof was dried up, that the way might by made ready for the kings that come from the sunrising.13 And I saw coming out of the mouth of the dragon, and out of the mouth of the beast, and out of the mouth of the false prophet, three unclean spirits, as it were frogs:14 for they are spirits of demons, working signs; which go forth unto the kings of the whole world, to gather them together unto the war of the great day of God, the Almighty.15 (Behold, I come as a thief. Blessed is he that watcheth, and keepeth his garments, lest he walked naked, and they see his shame.)16 And they gathered them together into the place which is called in Hebrew Har-magedon.17 And the seventh poured out his bowl upon the air; and there came forth a great voice out of the temple, from the throne, saying, It is done:18 and there were lightnings, and voices, and thunders; and there was a great earthquake, such as was not since there were men upon the earth, so great an earthquake, so mighty.19 And the great city was divided into three parts, and the cities of the nations fell: and Babylon the great was remembered in the sight of God, to give unto her the cup of the wine of the fierceness of his wrath.20 And every island fled away, and the mountains were not found.21 And great hail, every stone about the weight of a talent, cometh down out of heaven upon men: and men blasphemed God because of the plague of the hail; for the plague thereof is exceeding great.