NKPUGHE 21
1 M'we hu elu-igwe ọhu na uwa ọhu: n'ihi na elu-igwe mbu ahu na uwa mbu ahu gabigarari; oké osimiri adighi kwa ọzọ. 2 M'we hu obodo nsọ ahu, bú Jesusalem ọhu, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, site n'ebe Chineke nọ, edoziwo ya dika nwanyi anālu ọhu nke achọworo ya nma nye di-ya. 3 M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'oche-eze ahu dà, si, Le, ūlọ-ikwū nke Chineke diyere madu, Ọ gēbiye-kwa-ra ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nke Ya, Chineke Onwe-ya gānọye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke-ha: 4 Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo. 5 Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n'ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu. 6 O we sim, Emewo ha. Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, nmalite na ọgwugwu. Mu onwem gēnye onye akpiri nākpọ nku miri site n'isi-iyi miri nke ndu ahu n'efu. 7 Onye nēmeri gēketa ihe ndia; M'gābu-kwa-ra ya Chineke, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa.
8 Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.
9 Otù nime ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu, ndi eboro ibu ihe-otiti asa ikpe-azu, we bia; o we kpayerem uka, si, Biari, M'gēgosi gi nwanyi ahu anālu ọhu, bú nwunye Nwa-aturu ahu. 10 O we bupum nime Mọ Nsọ ga rue oké ugwu di elu, we gosim obodo nsọ ahu, bú Jerusalem, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, site n'ebe Chineke nọ, 11 nēnwe ebube Chineke: ìhè ọ nēnye yiri nkume dikarisiri oké ọnu-ahia, dika nkume jasper, dika crystal: 12 o nwe-kwa-ra oké mb͕idi di elu; nwe kwa ọnu-uzọ-ama iri na abua, nwe kwa ndi-mọ-ozi iri na abua n'ọnu-uzọ-ama ahu; nwe kwa aha edekwasiworo ha, nke bu aha nke ebo iri na abua nke umu Israel: 13 n'akuku Ọwuwa-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di; n'akuku Ugwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n'akuku Ndida ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n'akuku Ọdida-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa. 14 Mb͕idi obodo ahu nwe-kwa-ra ntọ-ala iri na ab͕ua, n'elu ha ka edereri aha iri na abua nke ndi-ozi iri na abua ahu nke Nwa-aturu ahu. 15 Onye ahu nke nākpayerem uka nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù, bú amì nke ọla-edo, ka o we tùa obodo ahu, na ọnu-uzọ-ama-ya nile, na mb͕idi-ya. 16 Obodo ahu nwe-kwa-ra nkuku anọ ra nrata, ogologo-ya ra kwa ka obodobo-ya: o we were amì ahu tùa obodo ahu, orú nnù furlong na nnù iri: ogologo-ya na obodobo-ya na elu-ya ra. 17 O we tù mb͕idi-ya, ọgu cubit asa na anọ, dika ọtùtù madu si di, ya bu, nke mọ-ozi. 18 Ihe eji lu mb͕idi ahu bu jasper: obodo ahu bu kwa ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nēnwu enwu. 19 Ewerewo nkume nile ọ bula di oké ọnu-ahia chọ ntọ-ala nke mb͕idi obodo ahu nma. Ntọ-ala mbu bu jasper; nke-abua bu sapphire; nke-atọ bu chalcedony; nke-anọ bu emerald; 20 nke-ise bu sardonyx; nke-isi bu sardius; nke-asa bu chrysolite; nke-asatọ bu beryl; nke-iteghete bu topaz; nke-iri bu chrysoprase; nke-iri-na-otù bu jacinth; nke-iri-na-abua bu amethyst. 21 Ọnu-uzọ-ama iri na abua ahu bu pearl iri na abua; eji otù pearl me ọnu-uzọ-ama ọ bula nime ọnu-uzọ-ama ahu nile: amá obodo ahu bu ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nāhu uzọ. 22 Ọ dighi kwa ulo nsọ ọ bula m'huru nime ya: n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Ya na Nwa-aturu ahu, bu ulo nsọ ya. 23 Anyanwu ma-ọbu ọnwa adighi kwa obodo ahu nkpà, ka ha mukwasi ya: n'ihi na ebube Chineke nyere ya ìhè, oriọna-ya bu kwa Nwa-aturu ahu. 24 Mba nile gēwere kwa ìhè-ya jegharia: ndi-eze nke uwa nēwebata kwa ebube-ha nime ya. 25 Agaghi-emechi kwa ọnu-uzọ-ama-ya n'ehihie ma-ọli (n'ihi na abali agaghi-adi n'ebe ahu): 26 ha gēwebata kwa ebube na nsọpuru nke mba nile nime ya: 27 ọ dighi kwa ihe ọ bula emeruru emeru, ma-ọbu onye nēme ihe-árú na ugha, gābà nime ya ma-ọli: kama ọ bu nání ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ nke ndu Nwa-aturu ahu.
Revelation 21
1 And I saw a new heaven and a new earth: for the first heaven and the first earth are passed away; and the sea is no more.2 And I saw the holy city, new Jerusalem, coming down out of heaven from God, made ready as a bride adorned for her husband.3 And I heard a great voice out of the throne saying, Behold, the tabernacle of God is with men, and he shall dwell with them, and they shall be his peoples, and God himself shall be with them, and be their God:4 and he shall wipe away every tear from their eyes; and death shall be no more; neither shall there be mourning, nor crying, nor pain, any more: the first things are passed away.5 And he that sitteth on the throne said, Behold, I make all things new. And he saith, Write: for these words are faithful and true.6 And he said unto me, They are come to pass. I am the Alpha and the Omega, the beginning and the end. I will give unto him that is athirst of the fountain of the water of life freely.7 He that overcometh shall inherit these things; and I will be his God, and he shall be my son.8 But for the fearful, and unbelieving, and abominable, and murderers, and fornicators, and sorcerers, and idolaters, and all liars, their part shall be in the lake that burneth with fire and brimstone; which is the second death.9 And there came one of the seven angels who had the seven bowls, who were laden with the seven last plagues; and he spake with me, saying, Come hither, I will show thee the bride, the wife of the Lamb.10 And he carried me away in the Spirit to a mountain great and high, and showed me the holy city Jerusalem, coming down out of heaven from God,11 having the glory of God: her light was like unto a stone most precious, as it were a jasper stone, clear as crystal:12 having a wall great and high; having twelve gates, and at the gates twelve angels; and names written thereon, which are the names of the twelve tribes of the children of Israel:13 on the east were three gates; and on the north three gates; and on the south three gates; and on the west three gates.14 And the wall of the city had twelve foundations, and on them twelve names of the twelve apostles of the Lamb.15 And he that spake with me had for a measure a golden reed to measure the city, and the gates thereof, and the wall thereof.16 And the city lieth foursquare, and the length thereof is as great as the breadth: and he measured the city with the reed, twelve thousand furlongs: the length and the breadth and the height thereof are equal.17 And he measured the wall thereof, a hundred and forty and four cubits, according to the measure of a man, that is, of an angel.18 And the building of the wall thereof was jasper: and the city was pure gold, like unto pure glass.19 The foundations of the wall of the city were adorned with all manner of precious stones. The first foundation was jasper; the second, sapphire; the third, chalcedony; the fourth, emerald;20 the fifth, sardonyx; the sixth, sardius; the seventh, chrysolite; the eighth, beryl; the ninth, topaz; the tenth, chrysoprase; the eleventh, jacinth; the twelfth, amethyst.21 And the twelve gates were twelve pearls; each one of the several gates was of one pearl: and the street of the city was pure gold, as it were transparent glass.22 And I saw no temple therein: for the Lord God the Almighty, and the Lamb, are the temple thereof.23 And the city hath no need of the sun, neither of the moon, to shine upon it: for the glory of God did lighten it, and the lamp thereof is the Lamb.24 And the nations shall walk amidst the light thereof: and the kings of the earth bring their glory into it.25 And the gates thereof shall in no wise be shut by day (for there shall be no night there):26 and they shall bring the glory and the honor of the nations into it:27 and there shall in no wise enter into it anything unclean, or he that maketh an abomination and a lie: but only they that are written in the Lamb’s book of life.