previous

NKPUGHE 22

1 O we gosim osimiri nke miri nke ndu, nēnwu dika crystal, ka ọ nēsi n'oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu puta, 2 n'etiti amá-ya. N'akuku a na n'akuku nke-ọzọ nke osimiri ahu ka osisi nke ndu di kwa, nāmi uzọ nkpuru iri na abua, nēnye nkpuru-ya n'ọnwa n'ọnwa: akwukwọ osisi ahu bu ihe ime ka aru di mba nile ike. 3 Ọbubu-ọnu ọ bula agaghi-adi ọzọ: oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu gādi kwa nime ya: ndi-orù-Ya gēfè kwa Ya òfùfè: 4 ha gāhu kwa iru-Ya; aha-Ya gādi kwa n'egedege-iru-ha.

5 Abali agaghi-adi kwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwu adighi kwa ha nkpà; n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke gēnye ha ìhè: ha ganābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.
6 O we sim, Okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu: Onye-nwe-ayi, bú Chineke nke ndi-mọ nke ndi-amuma, zite-kwa-ra mọ-ozi-Ya igosi ndi-orù-Ya ihe nile nāghaghi iputa na mb͕e ntà.

7 Le kwa, anamabia ọsọsọ. Ngọzi nādiri onye nēdebe okwu nile nke amuma nke akwukwọ a.
8 Mu onwem Jọn bu kwa onye nānu nāhu kwa ihe ndia. Mb͕e m'nuru, hu kwa, m'we da n'ala ikpọ isi ala n'iru ukwu mọ-ozi ahu onye nēgosim ihe ndia.

9 O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi, bú ndi-amuma, ha na ndi nēdebe okwu nile nke akwukwọ a: kpọ isi ala nye Chineke.
10 O we sim, Akala okwu nile nke amuma nke akwukwọ a akàrà; n'ihi na oge ahu di nso. 11 Onye nēme ajọ omume, ya me ajọ omume ga n'iru: onye ru-kwa-ra inyi, ka eme ka o ru inyi ga n'iru: onye ezi omume, ya me ezi omume ga n'iru: onye di kwa nsọ, ka edo ya nsọ ga n'iru. 12 Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n'akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di. 13 Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, onye mbu na onye ikpe-azu, nmalite na ọgwugwu. 14 Ngọzi nādiri ndi nāsa uwe-nwuda-ha, ka ha we nwe ike n'ebe osisi nke ndu ahu di, si kwa n'ọnu-uzọ-ama ahu ba nime obodo ahu.

15 N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.

16 Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.

17 Mọ Nsọ na nwanyi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n'efù.
18 Mu onwem nāb͕ara onye ọ bula àmà, bú onye nānu okwu nile nke amuma nke akwukwọ a, si, Ọ buru na onye ọ bula gātukwasiri ha okwu, Chineke gātukwasiri ya ihe-otiti nile nke edeworo n'akwukwọ a:

19 ọ buru kwa na onye ọ bula gēwepu okwu nime okwu nile nke akwukwọ nke amuma nka, Chineke gēwepu òkè-ya n'osisi nke ndu ahu, wepu kwa òkè-ya n'obodo nsọ ahu, bú ihe edeworo n'akwukwọ a.

20 Onye ahu Nke nāb͕a àmà ndia nāsi, E: anamabia ọsọsọ. Amen: bia, Onye-nwe-ayi Jisus.
21 Ka amara Onye-nwe-ayi Jisus diyere ndi nsọ nile. Amen.

Revelation 22

1 And he showed me a river of water of life, bright as crystal, proceeding out of the throne of God and of the Lamb,2 in the midst of the street thereof. And on this side of the river and on that was the tree of life, bearing twelve manner of fruits, yielding its fruit every month: and the leaves of the tree were for the healing of the nations.3 And there shall be no curse any more: and the throne of God and of the Lamb shall be therein: and his servants shall serve him;4 and they shall see his face; and his name shall be on their foreheads.5 And there shall be night no more; and they need no light of lamp, neither light of sun; for the Lord God shall give them light: and they shall reign for ever and ever.6 And he said unto me, These words are faithful and true: and the Lord, the God of the spirits of the prophets, sent his angels to show unto his servants the things which must shortly come to pass.7 And behold, I come quickly. Blessed is he that keepeth the words of the prophecy of this book.8 And I John am he that heard and saw these things. And when I heard and saw, I fell down to worship before the feet of the angel that showed me these things.9 And he saith unto me, See thou do it not: I am a fellow-servant with thee and with thy brethren the prophets, and with them that keep the words of this book: worship God.10 And he saith unto me, Seal not up the words of the prophecy of this book; for the time is at hand.11 He that is unrighteous, let him do unrighteousness still: and he that is filthy, let him be made filthy still: and he that is righteous, let him do righteousness still: and he that is holy, let him be made holy still.12 Behold, I come quickly; and my reward is with me, to render to each man according as his work is.13 I am the Alpha and the Omega, the first and the last, the beginning and the end.14 Blessed are they that wash their robes, that they may have the right to come to the tree of life, and may enter in by the gates into the city.15 Without are the dogs, and the sorcerers, and the fornicators, and the murderers, and the idolaters, and every one that loveth and maketh a lie.16 I Jesus have sent mine angel to testify unto you these things for the churches. I am the root and the offspring of David, the bright, the morning star.17 And the Spirit and the bride say, Come. And he that heareth, let him say, Come. And he that is athirst, let him come: he that will, let him take the water of life freely.18 I testify unto every man that heareth the words of the prophecy of this book, if any man shall add unto them, God shall add unto him the plagues which are written in this book:19 and if any man shall take away from the words of the book of this prophecy, God shall take away his part from the tree of life, and out of the holy city, which are written in this book.20 He who testifieth these things saith, Yea: I come quickly. Amen: come, Lord Jesus.21 The grace of the Lord Jesus be with the saints. Amen.