previous next

NDI ROM 1

1 Pọl, orù nke Jisus Kraist, onye akpọrọ ibu onye-ozi, onye ekewapuru nye ozi ọma Chineke, 2 nke O buru uzọ kwere na nkwa site n'ọnu ndi-amuma-Ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ, 3 bayere Okpara-Ya, Onye amuru site na nkpuru Devid dika anu-aru si di, 4 Onye akaworo ibu Ọkpara Chineke n'ike, dika Mọ nke idi-nsọ si di, site na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu; bú Jisus Kraist Onye-nwe-ayi, 5 Onye ayi sitere n'aka-Ya nata amara na ọlu onye-ozi, rue iṅa-nti nke okwukwe n'etiti mba nile, n'ihi aha-Ya: 6 ndi unu onwe-unu nọ kwa n'etiti ha, ndi akpọrọ ibu ndi nke Jisus Kraist:

7 Pọl nka nēdegara ndi nile nọ na Rom akwukwọ, bú ndi Chineke huru n'anya, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke Nna-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist bia.
8 Mbu, anamekele Chinekem ekele site na Jisus Kraist bayere unu nile, na anēkwusa okwukwe-unu n'uwa dum. 9 N'ihi na Chineke, Onye m'nēkpere nime mọm n'ozi ọma nke Ọkpara-Ya, bu Onye-àmàm, otú m'nārapughi aka n'ihota unu, 10 nāriọ aririọ mb͕e nile n'ekperem nile, ọ buru na, ma eleghi anya, ub͕u a n'oge a ezi uzọ gādirim ibiakute unu, n'ihe Chineke nāchọ. 11 N'ihi na ihu unu anya nāgusim ike, ka m'kwe ka unu keta onyinye-amara ufọdu nke Mọ Nsọ, ka ewe me ka unu guzosie ike; 12 nke ahu bu, ka ewe kasie mu na unu obi n'etiti unu, site n'okwukwe ayi kwekọrọ, ma nke unu ma nke mu onwem. 13 Ma achọghi m ka unu ghara imara, umu-nnam, na ọtutu mb͕e m'zubere ibiakute unu (eb͕ochi-kwa-ram ibia rue ub͕u a), ka m'we nwe kwa nkpuru ufọdu n'etiti unu, dika ọ di kwa n'etiti ndi mba ọzọ fọduru. 14 Ejim madu nile ugwọ, ma ndi-Grik ma ndi nāsu asusu ọzọ, ma ndi mara ihe ma ndi nēnweghi uche. 15 Otú a, ka ihe bayere mu onwem ra, ọ dim ọku n'obi izì kwa unu ndi bi na Rom ozi ọma. 16 N'ihi na ihere ozi ọma ahu adighi-emem: n'ihi na ọ bu ike nke Chineke rue nzọputa nye onye ọ bula nke kwere; onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa.

17 N'ihi na anēkpughe ezi omume Chineke nime ya, site n'okwukwe rue okwukwe: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ma onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu.
18 N'ihi na esi n'elu-igwe kpughe iwe Chineke imegide asọpurughi-Chineke na ajọ omume nile nke madu, ndi nēb͕ochi ezi-okwu n'ajọ omume; 19 n'ihi na ihe apuru imata bayere Chineke nāputa ìhè nime ha; n'ihi na Chineke mere ka ọ putara ha ìhè. 20 N'ihi na ihe-Ya anya nāhughi site n'òkìkè uwa ka anāhu nke-ọma, ebe anāghọta ha site n'ihe nile ekère èkè, bú ike ebighi-ebi Ya na udi-Chineke-Ya; ka ha ghara inwe ngọpu: 21 n'ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n'ihe nile ha nātule n'obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri. 22 Mb͕e ha nēkwu na ha bu ndi mara ihe, ha we ghọ ndi-nzuzu,

23 we were ebube nke Chineke anāpughi imebi b͕anwere oyiyi nke onyinyo madu apuru imebi, na nke anu-ufe na anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu di iche iche.
24 N'ihi ya Chineke rara ha nye n'aka adighi-ọcha n'ihe ọjọ nile nāgu obi-ha, ka ewe me aru-ha ihe-ihere n'etiti ha:

25 ebe ha were ezi-okwu nke Chineke b͕anwere ugha-ha, ha we sọpuru nēkpe-kwa-ra ihe ekère èkè kama Onye kère èkè, Onye agọziworo ebighi-ebi. Amen.
26 N'ihi nka Chineke rara ha nye n'aka agu ihe-ihere: n'ihi na ndinyom-ha were nwanyi ha bu site n'ọmumu b͕anwere ihe nēmegide ka esi mu ha:

27 otú a ndikom rapu-kwa-ra otú anēme nwanyi site ka esi mu ya, we re ọku n'agu-ha n'aru ndikom-ibe-ha, ndikom nāluputa ihe nādighi nma n'anya n'aru ndikom, nānara kwa nime onwe-ha ugwọ-ọlu ahu nke njehie-ha nke ha nāghaghi inara.
28 Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi; 29 ebe ha juputara n'ajọ omume nile, ajọ ọlu, anya-uku, obi ọjọ; juputa kwa n'ekworo, ob͕ub͕u-madu, esem-okwu, aghughọ, uche ọjọ; ndi-ntakwu, 30 ndi nēkwutọ madu, ndi nākpọ Chineke asì, ndi nēme madu ihe-ihere, ndi-npako, ndi nānya isi, ndi nāchọputa ihe ọjọ, ndi nēkweyeghi ndi muru ha, 31 Ndi nēnweghi nghọta, ndi nēmebi ọb͕ub͕a-ndu, ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nēnweghi obi-ebere: 32 madu ndi, ọ bu ezie na ha mazuru ihe Chineke guru n'ihe ziri ezi, na ndi nēme ihe di otú a kwesiri ọnwu, ma ọ bughi nání na ha nēme ha, kama ndi nēme ha di kwa ha ezi nma.

Romans 1

1 Paul, a servant of Jesus Christ, called to be an apostle, separated unto the gospel of God,2 which he promised afore through his prophets in the holy scriptures,3 concerning his Son, who was born of the seed of David according to the flesh,4 who was declared to be the Son of God with power, according to the spirit of holiness, by the resurrection from the dead; even Jesus Christ our Lord,5 through whom we received grace and apostleship, unto obedience of faith among all the nations, for his name’s sake;6 among whom are ye also called to be Jesus Christ’s:7 To all that are in Rome, beloved of God, called to be saints: Grace to you and peace from God our Father and the Lord Jesus Christ.8 First, I thank my God through Jesus Christ for you all, that your faith is proclaimed throughout the whole world.9 For God is my witness, whom I serve in my spirit in the gospel of his Son, how unceasingly I make mention of you, always in my prayers10 making request, if by any means now at length I may be prospered by the will of God to come unto you.11 For I long to see you, that I may impart unto you some spiritual gift, to the end ye may be established;12 that is, that I with you may be comforted in you, each of us by the other’s faith, both yours and mine.13 And I would not have you ignorant, brethren, that oftentimes I purposed to come unto you (and was hindered hitherto), that I might have some fruit in you also, even as in the rest of the Gentiles.14 I am debtor both to Greeks and to Barbarians, both to the wise and to the foolish.15 So, as much as in me is, I am ready to preach the gospel to you also that are in Rome.16 For I am not ashamed of the gospel: for it is the power of God unto salvation to every one that believeth; to the Jew first, and also to the Greek.17 For therein is revealed a righteousness of God from faith unto faith: as it is written, But the righteous shall live by faith.18 For the wrath of God is revealed from heaven against all ungodliness and unrighteousness of men, who hinder the truth in unrighteousness;19 because that which is known of God is manifest in them; for God manifested it unto them.20 For the invisible things of him since the creation of the world are clearly seen, being perceived through the things that are made, even his everlasting power and divinity; that they may be without excuse:21 because that, knowing God, they glorified him not as God, neither gave thanks; but became vain in their reasonings, and their senseless heart was darkened.22 Professing themselves to be wise, they became fools,23 and changed the glory of the incorruptible God for the likeness of an image of corruptible man, and of birds, and four-footed beasts, and creeping things.24 Wherefore God gave them up in the lusts of their hearts unto uncleanness, that their bodies should be dishonored among themselves:25 for that they exchanged the truth of God for a lie, and worshipped and served the creature rather than the Creator, who is blessed for ever. Amen.26 For this cause God gave them up unto vile passions: for their women changed the natural use into that which is against nature:27 and likewise also the men, leaving the natural use of the woman, burned in their lust one toward another, men with men working unseemliness, and receiving in themselves that recompense of their error which was due.28 And even as they refused to have God in their knowledge, God gave them up unto a reprobate mind, to do those things which are not fitting;29 being filled with all unrighteousness, wickedness, covetousness, maliciousness; full of envy, murder, strife, deceit, malignity; whisperers,30 backbiters, hateful to God, insolent, haughty, boastful, inventors of evil things, disobedient to parents,31 without understanding, covenant-breakers, without natural affection, unmerciful:32 who, knowing the ordinance of God, that they that practise such things are worthy of death, not only do the same, but also consent with them that practise them.