previous next

NDI ROM 10

1 Umu-nnam, ihe di obim ezi nma na aririọ m'nāriọ Chineke n'ihi ha bu, ka azọputa ha. 2 N'ihi na anamab͕ara ha àmà na ha nānu ọku n'obi n'ebe Chineke nọ, ma ọ bughi dika nmazu si di. 3 N'ihi na, ebe ha nāmaghi ezi omume Chineke, nāchọ kwa uzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzo, ha edoghi onwe-ha n'okpuru ezi omume Chineke. 4 N'ihi na Kraist bu nsọtu iwu iwetara onye ọ bula nke kwere ezi omume. 5 N'ihi na Moses edewo n'akwukwọ na madu nke nēme ezi omume nke sitere n'iwu gādi ndu nime ya. 6 Ma ezi omume ahu nke sitere n'okwukwe nēkwu otú a, si, Asila n'obi-gi, Ònye gārigo n'elu-igwe? (nke ahu bu, ikudata Kraist:) 7 ma-ọbu, Ònye gārida n'abyss ahu? (nke ahu bu, isi na ndi nwuru anwu kugota Kraist.) 8 Kama ọ̀ bu gini ka ọ nēkwu? Okwu ahu di gi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi: nke ahu bu, okwu okwukwe, nke ayi nēkwusa: 9 na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí: 10 n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa. 11 N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya. 12 N'ihi na ọ dighi ihe di iche n'etiti onye-Ju na onye-Grik: n'ihi na otù Onye-nwe-ayi ahu bu Onye-nwe ọra madu, buru kwa Onye nwere àkù ri nne inye ndi nile nākpọku Ya: 13 n'ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya. 14 Hà gēsi kwa aṅa kpọku Onye ahu ha akēkweghi na Ya? ma hà gēsi aṅa kwere n'Onye ahu ha akānughi okwu-Ya? ma hà gēsi aṅa nu ma onye nēkwusa anọghi?

15 ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe!
16 Ma ọ bughi ha nile ṅara ozi ọma ahu nti. N'ihi na Aisaia nāsi, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo? 17 Ya mere, okwukwe si n'ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n'okwu Kraist.

18 Ma asim, Ọ̀ gābu na ha anughi? Ha nuru ezie,
N'uwa nile ka olu-ha puru jezue,
Na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.

19 Ma asim, Ọ̀ gābu na Israel amaghi? Moses buru uzọ si,
Mu onwem gēwere mba nābughi mba kpasue unu ekworo,
Mba nēnweghi nghọta ka M'gēwere kpasue unu iwe.

20 Ma Aisaia nwere anya-ike nke-uku, we si,
Ndi nāchọghm chọtaram;
Ewerem gosi ndi nājughi ajuju n'akam.
21 Ma Ọ nēkwu okwu bayere Israel, si, Ogologo ubọchi dum ka M'b͕asara akam nye ndi nādighi-ekwenye, ndi nēkwugidekwam.

Romans 10

1 Brethren, my heart’s desire and my supplication to God is for them, that they may be saved.2 For I bear them witness that they have a zeal for God, but not according to knowledge.3 For being ignorant of God’s righteousness, and seeking to establish their own, they did not subject themselves to the righteousness of God.4 For Christ is the end of the law unto righteousness to every one that believeth.5 For Moses writeth that the man that doeth the righteousness which is of the law shall live thereby.6 But the righteousness which is of faith saith thus, Say not in thy heart, Who shall ascend into heaven? (that is, to bring Christ down:)7 or, Who shall descend into the abyss? (That is, to bring Christ up from the dead.)8 But what saith it? The word is nigh thee, in thy mouth, and in thy heart: that is, the word of faith, which we preach:9 because if thou shalt confess with thy mouth Jesus as Lord, and shalt believe in thy heart that God raised him from the dead, thou shalt be saved:10 for with the heart man believeth unto righteousness; and with the mouth confession is made unto salvation.11 For the scripture saith, Whosoever believeth on him shall not be put to shame.12 For there is no distinction between Jew and Greek: for the same Lord is Lord of all, and is rich unto all that call upon him:13 for, Whosoever shall call upon the name of the Lord shall be saved.14 How then shall they call on him in whom they have not believed? and how shall they believe in him whom they have not heard? and how shall they hear without a preacher?15 and how shall they preach, except they be sent? even as it is written, How beautiful are the feet of them that bring glad tidings of good things!16 But they did not all hearken to the glad tidings. For Isaiah saith, Lord, who hath believed our report?17 So belief cometh of hearing, and hearing by the word of Christ.18 But I say, Did they not hear? Yea, verily, Their sound went out into all the earth, And their words unto the ends of the world.

19 But I say, Did Israel not know? First Moses saith, I will provoke you to jealousy with that which is no nation, With a nation void of understanding will I anger you.

20 And Isaiah is very bold, and saith, I was found of them that sought me not; I became manifest unto them that asked not of me.

21 But as to Israel he saith, All the day long did I spread out my hands unto a disobedient and gainsaying people.