NDI ROM 13
1 Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo. 2 Ya mere onye nēdo onwe-ya megide onye ahu nāchi isi, ọ nēguzogide iwu Chineke nyere: ma ndi nēguzogide gānata ikpé nye onwe-ha. 3 N'ihi na ndi-isi abughi ihe-egwu n'ebe ezi ọlu di, kama n'ebe ọlu ọjọ di. Ma ì chọghi ka i tua egwu onye ahu nāchi isi? nēme ezi ihe, i gēnwe kwa otuto site n'aka ya: 4 n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi n'ebe i nọ iwetara gi ezi ihe. Ma ọ buru na i nēme ihe ọjọ, tua egwu; n'ihi na ọ bughi n'efu ka o nēbu mma-agha: n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi, onye-ọ́bọ̀ iwetara onye nēme ihe ọjọ iwe. 5 N'ihi ya ọ di nkpà ido onwe-unu n'okpuru ya, ọ bughi nání n'ihi iwe ahu, kama ọ bu kwa n'ihi akọ-na-uche. 6 N'ihi na ọ bu n'ihi nka ka unu nātu kwa ùtú; n'ihi na ha bu ndi nēfè Chineke òfùfè, nānọgidesi ike n'ọlu-ha ime otù ihe a.
7 Nākwughachinu madu nile ihe nile unu ji ha n'ugwọ: tunu ùtú nye onye unu ji ugwọ ùtú; tunu ùtú-ahia nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia; tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu; sọpurunu onye unu ji ugwọ nsọpuru.
8 Unu ejila onye ọ bula ugwọ ọ bula, ma-ọbughi ihurita onwe-unu n'anya: n'ihi na onye nāhu madu-ibe-ya n'anya edebezuwo iwu. 9 N'ihi na okwu a, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Agu ihe ọjọ agula gi, ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di enyere n'iwu, achikọtara ya n'okwu a, bú, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.
10 Ihu-n'anya adighi-alu ọlu ọjọ n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: ya mere ihu-n'anya bu idebezu iwu.
11 Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu. 12 Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè. 13 Ka ayi nējeghari dika ọ kwesiri ayi, dika n'ehihie; ọ bughi n'ite-egwú na iṅubiga-manya-ókè, ọ bughi n'ikwa-iko na agu ikwa-iko, ọ bughi n'esem-okwu na ekworo. 14 Kama yikwasinu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, unu ebu-kwa-la uzọ nēchère aru, ime ihe ọjọ nāgu ya.
Romans 13
1 Let every soul be in subjection to the higher powers: for there is no power but of God; and the powers that be are ordained of God.2 Therefore he that resisteth the power, withstandeth the ordinance of God: and they that withstand shall receive to themselves judgment.3 For rulers are not a terror to the good work, but to the evil. And wouldest thou have no fear of the power? do that which is good, and thou shalt have praise from the same:4 for he is a minister of God to thee for good. But if thou do that which is evil, be afraid; for he beareth not the sword in vain: for he is a minister of God, an avenger for wrath to him that doeth evil.5 Wherefore ye must needs be in subjection, not only because of the wrath, but also for conscience’ sake.6 For this cause ye pay tribute also; for they are ministers of God’s service, attending continually upon this very thing.7 Render to all their dues: tribute to whom tribute is due; custom to whom custom; fear to whom fear; honor to whom honor.8 Owe no man anything, save to love one another: for he that loveth his neighbor hath fulfilled the law.9 For this, Thou shalt not commit adultery, Thou shalt not kill, Thou shalt not steal, Thou shalt not covet, and if there be any other commandment, it is summed up in this word, namely, Thou shalt love thy neighbor as thyself.10 Love worketh no ill to his neighbor: love therefore is the fulfilment of the law.11 And this, knowing the season, that already it is time for you to awake out of sleep: for now is salvation nearer to us than when we first believed.12 The night is far spent, and the day is at hand: let us therefore cast off the works of darkness, and let us put on the armor of light.13 Let us walk becomingly, as in the day; not in revelling and drunkenness, not in chambering and wantonness, not in strife and jealousy.14 But put ye on the Lord Jesus Christ, and make not provision for the flesh, to fulfil the lusts thereof.