previous next

NDI ROM 7

1 Ma-ọbu ùnu amaghi, umu-nnam (n'ihi na anamagwa ndi mara iwu okwu), na iwu bu onye-nwe madu ka oge ra ọ nādi ndu? 2 N'ihi na iwu kekọrọ nwanyi nke nwere di n'aru di-ya mb͕e di-ya nọ na ndu; ma ọ buru na di-ya nwuru, atọpuwo ya n'iwu nke di-ya. 3 Ya mere otú a, agākpọ ya nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche mb͕e di-ya nọ na ndu: ma ọ buru na di-ya nwuru, ọ puwo n'iwu nwere onwe-ya, nke nēme ya ka ọ ghara ibu nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche. 4 Ya mere, umu-nnam, esite-kwa-ra n'aru Kraist me ka unu onwe-unu nwua n'ebe iwu di; ka unu we lakuru di di iche, bú Onye emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi we miara Chineke nkpuru. 5 N'ihi na mb͕e ayi nọ n'anu-aru, ọchichọ ọjọ nile nke diri nmehie nile ayi, nke sitere n'aka iwu ahu, nālusi ọlu ike n'ihe nile di ayi n'aru imiri ọnwu nkpuru.

6 Ma ub͕u a atọpuwo ayi n'iwu ahu, ebe ayi nwuru n'ebe ihe ahu di nke ejidesiri ayi ike nime ya; ya mere ayi nābu orù n'idi-ọhu nke Mọ Nsọ, ọ bughi kwa n'idi-ochie nke ihe edeworo n'akwukwọ.
7 Gini ka ayi gēkwu kwa? Ìwu ahu bu nmehie? Chineke ekwela. Kama, m'gaghi-amawori nmehie, ma ọ buru na esiteghm n'aka iwu mara ya: n'ihi na m'gaghi-amatawori agu ihe ọjọ, ma ọ buru na iwu ahu asighi, Agu ihe ọjọ agula gi: 8 ma nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o were ihe enyere n'iwu luta agu ihe ọjọ nile n'otù n'otù nimem: n'ihi na nmehie bu ihe nwuru anwu ma iwu adighi ya. 9 Ma mu onwem nādi ndu otù mb͕e n'oge iwu nādigh: ma mb͕e ihe enyere n'iwu biara, nmehie ahu we di ndu ọzọ, mu onwem we nwua; 10 ihe ahu enyere n'iwu, nke nēdubà na ndu, nka ka m'huru na ọ bu ihe nēdubà n'ọnwu: 11 n'ihi na nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o sitere n'ihe enyere n'iwu ghọb͕uem, site kwa na ya b͕uem. 12 Ya mere iwu ahu di nsọ n'ezie, ihe enyere n'iwu di kwa nsọ, zi kwa ezi, buru kwa ezi ihe. 13 Ya mere, èzi ihe ahu ghọrọ ọnwu n'ebe m'nọ? Chineke ekwela. kama ọ bu nmehie, ka o we puta ìhè na ọ bu nmehie, site n'iwere ezi ihe ahu lutaram ọnwu; ka nmehie we site n'ihe ahu enyere n'iwu ghọ ihe nēmehie nke-uku ri nne. 14 N'ihi na ayi matara na iwu ahu bu ihe nke Mọ: ma mu onwem bu ihe nke anu-aru, erewokwam inọ n'okpuru nmehie. 15 N'ihi na ihe m'nāluta ka m'nāmagh: n'ihi na ihe m'nāchọ, ọ bughi ihe ahu ka m'nēme; kama ihe m'nākpọ asì, ihe ahu ka m'nēme. 16 Ma ọ buru na ihe m'nāchọghi, ihe ahu ka m'nēme, anamekweye iwu ahu na ọ bu ihe ọma. 17 Ma ub͕u a ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie. 18 N'ihi na amataram na ezi ihe adighi-ebi nimem, nke ahu bu, n'anu-arum: n'ihi na ichọ ihe ọma di nso n'ebe akam gēru, ma iluta ihe ọma adighi nso n'ebe akam gēru. 19 N'ihi na ezi ihe nke m'nāchọ ka m'nēmegh: kama ihe ọjọ nke m'nāchọghi, ihe ahu ka m'nēme. 20 Ma ọ buru na ihe m'nachọghi, ihe ahu ka m'nēme, ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie. 21 Ya mere ahurum iwu a, na ihe ọjọ dim nso n'ebe akam gēru, mu, bú onye nāchọ ime ihe ọma. 22 N'ihi na mu na iwu Chineke nēnwekọ obi-utọ dika madu imem si di: 23 ma anamahu iwu di iche n'ihe nile dim n'aru, nēbu agha megide iwu nke uchem, nādọtakwam n'agha nye iwu nke nmehie nke di n'ihe nile dim n'aru. 24 Madu nke hujuru anya ka mu onwem bu! ònye gādọputam n'aru nke ọnwu a? 25 Ma ekele diri Chineke na ndọputa sitere n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Ya mere otú a mu onwem ji uchem buru orù nke iwu Chineke; ma ejim anu-arum buru orù nke iwu nmehie.

Romans 7

1 Or are ye ignorant, brethren (for I speak to men who know the law), that the law hath dominion over a man for so long time as he liveth?2 For the woman that hath a husband is bound by law to the husband while he liveth; but if the husband die, she is discharged from the law of the husband.3 So then if, while the husband liveth, she be joined to another man, she shall be called an adulteress: but if the husband die, she is free from the law, so that she is no adulteress, though she be joined to another man.4 Wherefore, my brethren, ye also were made dead to the law through the body of Christ; that ye should be joined to another, even to him who was raised from the dead, that we might bring forth fruit unto God.5 For when we were in the flesh, the sinful passions, which were through the law, wrought in our members to bring forth fruit unto death.6 But now we have been discharged from the law, having died to that wherein we were held; so that we serve in newness of the spirit, and not in oldness of the letter.7 What shall we say then? Is the law sin? God forbid. Howbeit, I had not known sin, except through the law: for I had not known coveting, except the law had said, Thou shalt not covet:8 but sin, finding occasion, wrought in me through the commandment all manner of coveting: for apart from the law sin is dead.9 And I was alive apart from the law once: but when the commandment came, sin revived, and I died;10 and the commandment, which was unto life, this I found to be unto death:11 for sin, finding occasion, through the commandment beguiled me, and through it slew me.12 So that the law is holy, and the commandment holy, and righteous, and good.13 Did then that which is good become death unto me? God forbid. But sin, that it might be shown to be sin, by working death to me through that which is good; --that through the commandment sin might become exceeding sinful.14 For we know that the law is spiritual: but I am carnal, sold under sin.15 For that which I do I know not: for not what I would, that do I practise; but what I hate, that I do.16 But if what I would not, that I do, I consent unto the law that it is good.17 So now it is no more I that do it, but sin which dwelleth in me.18 For I know that in me, that is, in my flesh, dwelleth no good thing: for to will is present with me, but to do that which is good is not.19 For the good which I would I do not: but the evil which I would not, that I practise.20 But if what I would not, that I do, it is no more I that do it, but sin which dwelleth in me.21 I find then the law, that, to me who would do good, evil is present.22 For I delight in the law of God after the inward man:23 but I see a different law in my members, warring against the law of my mind, and bringing me into captivity under the law of sin which is in my members.24 Wretched man that I am! who shall deliver me out of the body of this death?25 I thank God through Jesus Christ our Lord. So then I of myself with the mind, indeed, serve the law of God; but with the flesh the law of sin.